Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ịchọpụtagharị Ịma Mma Nke Oge EkeresimesiIhe Atụ

Rediscovering the Christmas Season

ỤBỌCHỊ 17 NKE 25

Nabatá Otu Ezinụlọ

Nkpughe: Gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ n'ekwu gbasara otú esi wee nakwere anyị dị ka ụmụ Chineke site na Kraịst. Ọtụtụ ndị mmadụ na-anabata otu ezinụlọ ka ha nyere ha aka n'oge Ekeresimesi. Chọta otu onye ịnọ̀ n'ime ezinụlọ dị mkpa n'Ekeresimesi a ma mee atụmatụ ịbụrụ ha ezinụlọ ahụ dị ha mkpa.

Mkpaghari Uche: Gịnị bụ ihe dị iche n'etiti ịnabatà otu ezinụlọ ka i nyere ha aka n'oge Ekeresimesi na ịkpọbatà nwa nọ n'èzí ka ọ bụrụ onye otu ezinụlọ gị n'ezie? Gịnị ka ngosipụta a na-akọwa banyere nnọgide Chineke ịhụ anyị n'anya?

Nkwupụta Okwu: Kedụ ikike na ihe ùgwù gasị ụmụ ndị eze nwere? Kedụ ụzọ ụfọdụ ị n'adịghị ebi ndụ zụrụ okè dị ka nwa Chineke ị bụ̀?

Ahụmahụ: Chọta otu onye esi n'ezi wee nabata ka nwa n'ime ezinụlọ wee jụọ onye a ihe nnabata a pụtara ná ndụ ya. Depụta na nwa akwụkwọ ihe ahụmahụ onye a n'ekpughere gị banyere ibi ndụ dị ka nwa Chineke na ịhụ ndị ọzọ n'anya n'ụzọ dị otu ahụ.
Ụbọchị 16Ụbọchị 18

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Rediscovering the Christmas Season

Malite ihe omume Ekeresimesi dị ọhụrụ site n'ime ihe n'ụzọ n'abụghị otu esi emebu ya n'oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa. Ụbọchị mmalite dị́ mma maka ihe omume a bụ Disemba 1, ebe mmalite dị ọsọ karịa ụbọchị a n'enye ohere ime ya n'ụzọ n'adịghị enye nsogbu. Ihe omume a gụnyerè ajụjụ ntụgharị uche gasị na ihe ndị aga-eme n'usoro iji kwụwa kwa ụbọchị chịm na Kraịst. Ihe omume a marà ezigbo mma maka ndị mmadụ ime ya n'otu n'otu, ezinụlọ imekọta ya, ma ọ bụ obere otù gasị imekọta ya.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka mmesapụ aka ha n'inye usoro ọgụgụ maka atụmatụ ihe ọgụgụ bụ "Rediscovering the Christmas Season". Iji mụtakwuo gbasara Life.Church, gaa na webụsaịtị ha na www.life.church