Ma asim na ka oge ra onye-nketa ahu nọ ka nwa ọhu, ọ dighi iche n'ihe ọ bula n'ebe orù nọ, ọ bu ezie na ọ bu onye-nwe ihe nile; kama ọ nọ n'okpuru ndi etiyere ya n'aka-ha na ndi nāchi èzí-na-ulo-ya rue oge nna-ya buru uzọ ka àka. Otú a ayi onwe-ayi kwa, mb͕e ayi bu umu ọhu, ọ bu n'okpuru ihe-ozizí mbu nke uwa ka ejidere ayi dika orù ma mb͕e oge ahu zuru, Chineke ziputara Ọkpara-Ya, Onye amuru site na nwanyi, Onye amuru n'okpuru iwu, ka O we b͕aputa ndi nọ n'okpuru iwu, ka ayi we nata idi-ka-umu-ndikom ahu. Ma n'ihi na unu bu umu-ndikom, Chineke ziputara Mọ nke Ọkpara-Ya ba nime obi-ayi, nēti nkpu, si, Aba, Nna. Ya mere i bughi orù ọzọ, kama i bu nwa-nwoke; ma ọ buru na i bu nwa-nwoke, i bu kwa onye-nketa site n'aka Chineke.
Gụọ NDI GALETIA 4
Geere nke a ntị NDI GALETIA 4
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI GALETIA 4:1-7
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị