Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Banyere YouVersion

Otu Ihe Si Dị Mkpa

N'ọgbọ ndị gara aga, oherè ndị mmadụ nwerè inweta na igụ Akwụkwọ Nsọ dị nnọọ ntakịrị. Taa, ọ dịghịzi otù ahụ. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị nweré ike inweta ma gụọ Akwụkwọ Nsọ na-eche na ozi Ya abaghị uru maka ndụ ha n'ebị ugbu a. N'otu oge ahụ, e nwere ndị ọzọ kwenyere na e nwere njikọ dị n'etiti Akwụkwọ Nsọ na ahụmahụ ha gasị kwa ụbọchị.

Mgbanwe-Ike Nke Ozi

N'ime afọ iri gara aga, ịntanetị ebutela mgbanwe-ike nke n'enye ndị mmadụ ike dị ka a dịtụbeghị mbụ. Site n'ikike nke ime nkekọrịta, inye aka, ịmepụta ihe, igbasa ozi na ịkparịta ụka, ọ dị mfe ikwupụta ndị anyị bụ na ihe anyị kwenyerè na ya nye ndị ụwa dum.

YouVersion YuuVershionụ

Kemgbe ọ malitere na 1996, nzube Life.Church bụ iduru ndị mmadụ ka ha ghọọ ndị n'eso ụzọ Kraịst n’ụzọ zuru ezù. N’ime otú ahụ, anyị achọpụtala ụzọ ọhụrụ anyị ga-esi nyere ndị mmadụ aka ijikọ Akwụkwọ Nsọ na ndụ ha n'ebi kwa ụbọchị. Ụzọ gasị anyị si eme ihe agbanweela kemgbe ọtụtụ afọ ka anyị jì teknọlọji gasị na atụmatụ dị iche iche mee ihe. Ma nke bụ́ isi, anyị na-elekwasị anya na ihe dị mkpa ka anyị na-agbalịsi ike igosi na ịkụziri ndị mmadụ otú Okwu Chineke si metụta onye ọ bụla, n’agbanyeghị ebe ha nọ ná ndụ. YouVersion na-egosipụta mpaghara ọhụrụ ná mbọ gasị Life.Church n'agba. Ọ bụghị naanị na anyị na-ewu ngwaọrụ iji metụta ụwa site na iji teknọlọji ọhụrụ, nke ka mkpa, anyị na-etinye ndị mmadụ ka ha na Chineke n'enwe mmekọrịta gasị ka ha na-achọpụta ọdị̀ mkpà Akwụkwọ Nsọ nwere maka ndụ ha.