Ịchọpụtagharị Ịma Mma Nke Oge EkeresimesiIhe Atụ
Okwu Mmalite Na Nkọwa Nke Ihe Omume A
Gịnị bụ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa? Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa sitere na okwu Latin bụ adventus nke pụtara mbịaru ma ọ bụ ọbịbịa. Ndị Hibru nọ na-atụ anya ọbịbịa nke Onye-nzọpụta ma-ọbụ Mezaya—nke a bụ Ọbịbịa nke Mbụ. Ugbu a, anyị ji obi anyị niile n'echere nloghachi Ya ka O bịa para nwunye Ya bụ anyị—nke a bụ Ọbịbịa nke Abụọ. Nzukọ-nsọ nọ n'eche Ya ka Ọ bịaghachi kemgbe Ọ lara eluigwe site n'oge mbụ.
Gịnị mere m ga-eji sonye na ememe Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa? Eé, gịnị jikọrọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa na ime ememe nke ọbịbịa Jizọs? Ka e si eme ya, a n'ebido gụwa Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa izu anọ n'eduga na Ekeresimesi. N'obibi ndụ anyị, Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa na-echetara anyị ka anyị na-atụ anya nloghachi Ya kwa ụbọchị. Oge a bụ maka ịtọgharị Jizọs Kraịst ka Ọ bụrụ Isi n'etiti ndụ anyị. E kwuwe, mgbe Ọ ga-abịa ịkpọrọ anyị laa n'ụlọ nke ebighị ebi anyị, anyị chọrọ ịdị njikere maka nke a. Na-atụ anya ka akwalite mmụọ gị, ka a maa gị aka, ka akpazie nlekwasị anya gị, ka e tiwaa obi ike gị, ka a gbaa obi gị ume, ka ịdị́ nchịkọta n'akụkụ ndụ gị niile ghasara aghasa, ka e mesie ahụ gị na obi gị ike, na nke kachasị, na-atụ anya ihe ebube ime gị.
Kedụ Otu M Ga-esi Eji Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A Mee Ihe? E nwere ajụjụ ntụgharị uche kwa ụbọchị yana ihe a chọrọ ka ị mee iji nyere gị aka mee ka Jizọs bụrụ Onyeisi nke ụbọchị gị ahụ. Ị nwere ike ịgụ ihe a n'usoro ma ọ bụ gị megharịa aka wee họrọ ụbọchị ị chere ga-akacha dị uru nye gị. Ị nwere ike ịgụ ihe ọgụgụ a naanị gị, mana chee otu ị ga-esi eme ka gị na ndị mmadụ ma ọ bụ ezinụlọ gị gụọ ya. Ụfọdụ ihe ndị asị gị mee nwere ịbụ ihe ndị ị na-emerị̀ n'oge Ekeresimesi, mana e nyere arọ otú ị ga-esi tụlee uche na ha n'ụzọ ga-enye Kraịst otito. Ihe omume ndị ọzọ nwere ike ịbụ ihe ndị ị na-emetụbeghị mbụ, ya mere meghee obi gị ma dị njikere ịnwale ihe ọhụrụ. Ụbọchị ọ bụla ga-agụnye Nkpughe, Mkpaghari Uche, Nkwupụta Okwu, na Ahụmahụ. Ị nwere ike ịchọpụta na ọdị mkpa ka ị gụọ Ọdịnaya Agbakwunyere kwa ụbọchị tupu gị gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ a tụrụ, iji duzie gị n'ihe ị na-achọ.
Nkpughe: Gụọ akụkọ banyere mmadụ abụọ nọ n'echere kwa ụbọchị n'ụlọ nsọ maka ọbịbịa Jizọs. Iji tinye ihe ama ama ga-eme ka ọ dịkwuo irè, mee nchọgharị na weebụ gbasara ngwakọta-flawa eji eme ememe Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa wee guzobe ihe dị ka ya n'ụlọ gị iji mee ihe n'oge a. Nke gị nwere ike ịdị mfe dị ka kandụl anọ ahaziri n'ụzọ dị okirikiri.
Mkpaghari Uche: Kparịta ụka ma ọ bụ detuo ihe na nwa akwụkwọ gbasara mmadụ abụọ a gọziri site n'ime ka ha jiri anya ha abụọ hụ ịhụ Onye-Nzọpụta nke Chineke. Kedụ ka ndụ gị nwere ike isi gosipụta ụdị atụmanya a?
Nkwupụta Okwu: Chee echiche banyere otú ị si atụ anya Ekeresimesi. Olee nha n'ime obi ụtọ gị a gbadoro ụkwụ na ọbịbịa nke Kraịst?
Ahụmahụ: Tupu gị malite njem a dị ụbọchị iri abụọ na ise, wepụta ezigbo oge kpee ekpere. Rịọ Chineke ka O meghee anya gị ka ahụmanya gị banyere Jizọs dị ezigbo ucha ma saa ka anyanwụ, karịa ka ị si ahụbú Ya. Rịọ Chineke ka O mee ka ị mara nke ọma ihe ibi ndụ gị na atụmanya nke Ọbịbịa Jizọs pụtara. Ọbụna na nke onwe, mgbe Jizọs ga-abịa, ndụ n'ezie ga-abụ OBIBI MAGBURU ONWE YA. Ka anyị nwee ahụmahụ a n'uju n'oge Ekeresimesi a!

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Malite ihe omume Ekeresimesi dị ọhụrụ site n'ime ihe n'ụzọ n'abụghị otu esi emebu ya n'oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa. Ụbọchị mmalite dị́ mma maka ihe omume a bụ Disemba 1, ebe mmalite dị ọsọ karịa ụbọchị a n'enye ohere ime ya n'ụzọ n'adịghị enye nsogbu. Ihe omume a gụnyerè ajụjụ ntụgharị uche gasị na ihe ndị aga-eme n'usoro iji kwụwa kwa ụbọchị chịm na Kraịst. Ihe omume a marà ezigbo mma maka ndị mmadụ ime ya n'otu n'otu, ezinụlọ imekọta ya, ma ọ bụ obere otù gasị imekọta ya.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka mmesapụ aka ha n'inye usoro ọgụgụ maka atụmatụ ihe ọgụgụ bụ "Rediscovering the Christmas Season". Iji mụtakwuo gbasara Life.Church, gaa na webụsaịtị ha na www.life.church