Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ịchọpụtagharị Ịma Mma Nke Oge EkeresimesiIhe Atụ

Rediscovering the Christmas Season

ỤBỌCHỊ 9 NKE 25

Aha Ya Gasị

Nkpughe: Gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ n'ekwu gbasara ọbịbịa mbụ Jizọs na ọbịbịa nke abụọ Ya. Gee ntị na “Ukwe Halleluya” ma ọ bụ “A Mụụrụ Anyị Nwata” sitere na “Mezaya” nke Handel—ha abụọ dị mfe ịchọta n'ịntanetị.

Mkpaghari Uche: Rịba ama otú esi akpọsi aha Jizọs ike n'okwu egwú ndị a. Kedụ ka aha gị si dị gị mkpa?

Nkwupụta Okwu: Kedụ ihe aha Jizọs ọbụla pụtara nye gị kpọmkwem? Gị na ndị enyi gị ma ọ bụ ezinụlọ gị kparịta ma ọ bụ gị depụta na nwa akwụkwọ otu Jizọs si egosipụta Onwe Ya n'ụzọ dị iche iche ndị a na ndụ gị.

Ahụmahụ: Ị̀ nweela ahụmahụ nke Jizọs igosipụta Onwe Ya dị ka Onye Ndụmọdụ Magburú Onwe Ya, Chineke Dị Ike, Nna Ebighị Ebi na Onye-isi Udo? Kedụ ka O si bụrụ Eze nke ndị eze na Onyenwenụ nke ndị nwenụ? Ugbu a, gụọ nkwado na agbamume e nyere Timoti etu anyị ga-esi ebi ndụ dị́ njikere izute Eze anyị.
Ụbọchị 8Ụbọchị 10

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Rediscovering the Christmas Season

Malite ihe omume Ekeresimesi dị ọhụrụ site n'ime ihe n'ụzọ n'abụghị otu esi emebu ya n'oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa. Ụbọchị mmalite dị́ mma maka ihe omume a bụ Disemba 1, ebe mmalite dị ọsọ karịa ụbọchị a n'enye ohere ime ya n'ụzọ n'adịghị enye nsogbu. Ihe omume a gụnyerè ajụjụ ntụgharị uche gasị na ihe ndị aga-eme n'usoro iji kwụwa kwa ụbọchị chịm na Kraịst. Ihe omume a marà ezigbo mma maka ndị mmadụ ime ya n'otu n'otu, ezinụlọ imekọta ya, ma ọ bụ obere otù gasị imekọta ya.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka mmesapụ aka ha n'inye usoro ọgụgụ maka atụmatụ ihe ọgụgụ bụ "Rediscovering the Christmas Season". Iji mụtakwuo gbasara Life.Church, gaa na webụsaịtị ha na www.life.church