Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ịchọpụtagharị Ịma Mma Nke Oge EkeresimesiIhe Atụ

Rediscovering the Christmas Season

ỤBỌCHỊ 11 NKE 25

Sno

Nkpughe: Gụọ ihe ndekọ nke okike sitere na Jenesis. Mee ihe sno yiri mmadụ. Jiri sno n'ezie o bụrụ na ị nwere ya, ma ọ bụ gị chọọ ụzọ dị iche iche ị pụrụ imepụta mmadụ sno. Ị nwere ike iji bọọlụ owu, akwụkwọ a kpụrụ akpụ, ma ọ bụ gị see mmadụ sno gị ese.

Mkpaghari Uche: Olee otú ịkpụ mmadụ sno si dị ka ihe Chineke n'eme anyị—n'oge okike na mbụ, nakwa n'ije anyị na Ya kwa ụbọchị?

Nkwupụta Okwu: Gwa Chineke ka obi gị si jupụta n'ekele na Ọ n'akpụzi anyị akwụsịghị akwụsị ka anyị na-adị ka Jizọs. Nye nkọwa gbasara otu oge na ndụ gị mgbe ị maara nke ọma na Chineke na-akpụzi gị ka ị dị ka Jizọs.

Ahụmahụ: Gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-akọ gbasara sno. Dabere na akụkụ ụwa ebe ị bi, o nwere ike ọdịda sno agaghị adị gị ka ọ bụ oge Ekeresimesi. Mana akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a na-ejikọta mgbaghara Jizọs na sno. Gị na ndị enyi gị na ndị ezinụlọ gị kparịta ma ọ bụ gị detuo na nwa akwụkwọ echiche gị gasị gbasara ihe ọ pụtara nye gị Chineke ime gị ka ị dị ọcha ka sno.
Ụbọchị 10Ụbọchị 12

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Rediscovering the Christmas Season

Malite ihe omume Ekeresimesi dị ọhụrụ site n'ime ihe n'ụzọ n'abụghị otu esi emebu ya n'oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa. Ụbọchị mmalite dị́ mma maka ihe omume a bụ Disemba 1, ebe mmalite dị ọsọ karịa ụbọchị a n'enye ohere ime ya n'ụzọ n'adịghị enye nsogbu. Ihe omume a gụnyerè ajụjụ ntụgharị uche gasị na ihe ndị aga-eme n'usoro iji kwụwa kwa ụbọchị chịm na Kraịst. Ihe omume a marà ezigbo mma maka ndị mmadụ ime ya n'otu n'otu, ezinụlọ imekọta ya, ma ọ bụ obere otù gasị imekọta ya.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka mmesapụ aka ha n'inye usoro ọgụgụ maka atụmatụ ihe ọgụgụ bụ "Rediscovering the Christmas Season". Iji mụtakwuo gbasara Life.Church, gaa na webụsaịtị ha na www.life.church