Ịchọpụtagharị Ịma Mma Nke Oge EkeresimesiIhe Atụ
Agaghị Ekwe Omume
Nkpughe: Gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ n'ekwu gbasara ọbịbịa nke nwa ọhụrụ dị ịtụnanya nke na ekweghị na ọmụmụ Ya bụ ihe ezi okwu ma ọ bụ nke mere eme. Chineke n'edozi ihe n'ụzọ a dị ịrịba ama maka ọbịbịa Jizọs Kraịst—bụ́ Onye a ga-eji ime ihe na-agaghị ekwe omume mara.
Mkpaghari Uche: Gịnị mere i ji chee na ọ na-atọ Chineke ụtọ ime ihe na-agaghị ekwe omume?
Nkwupụta Okwu: Chineke Ọ na-asị gị kwere ugbu a nà ihe n'adịghị ekwe omume ga-adị irè na anya gị? Dee ihe ị chọrọ ịrịọ Ya maka Ekeresimesi a nke yiri ihe n'agaghị ekwe omume.
Ahụmahụ: Gị na ndị enyi gị ma ọ bụ ezinụlọ gị kparịta ma ọ bụ gị detuo na nwa akwụkwọ banyere otu oge na ndụ gị mgbe iji ike gị niile dabere na Jizọs ka O meere gị ihe nyiri omume. Jiri olu ike gụpụta n'ebe ọbụla ịnọ amaokwu banyere Chineke anyị nke n'eme ihe nyiri omume.

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Malite ihe omume Ekeresimesi dị ọhụrụ site n'ime ihe n'ụzọ n'abụghị otu esi emebu ya n'oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa. Ụbọchị mmalite dị́ mma maka ihe omume a bụ Disemba 1, ebe mmalite dị ọsọ karịa ụbọchị a n'enye ohere ime ya n'ụzọ n'adịghị enye nsogbu. Ihe omume a gụnyerè ajụjụ ntụgharị uche gasị na ihe ndị aga-eme n'usoro iji kwụwa kwa ụbọchị chịm na Kraịst. Ihe omume a marà ezigbo mma maka ndị mmadụ ime ya n'otu n'otu, ezinụlọ imekọta ya, ma ọ bụ obere otù gasị imekọta ya.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka mmesapụ aka ha n'inye usoro ọgụgụ maka atụmatụ ihe ọgụgụ bụ "Rediscovering the Christmas Season". Iji mụtakwuo gbasara Life.Church, gaa na webụsaịtị ha na www.life.church