Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ịchọpụtagharị Ịma Mma Nke Oge EkeresimesiIhe Atụ

Rediscovering the Christmas Season

ỤBỌCHỊ 14 NKE 25

Kaadị Ekeresimesi

Nkpughe: Gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ n'akọ gbasara akwụkwọ-ozi agbamume. Ọtụtụ akụkụ nke Agbara Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ jupụtara na akwụkwọ-ozi. Zuo ma ọ bụ mee Kaadị Ekeresimesi nye onye bụụrụ gị ngọzi n'ezie n'afọ a. Wepụtakwuo oge na-agwa ha ihe ha pụtara nye gị. Ọ bụrụ na kaadị agaghị ejidenwu ihe niile ị chọrọ ikwu, depụta nnọọ otu akwụkwọ-ozi dị ogologo dịka ndị ụka mbụ mere.

Mkpaghari Uche: Chee echiche otú akwụkwọ-ozi ndị a si wee bụrụ ihe bara uru na narị afọ mbụ. Kedụ ụdị nzikọrịta-ozi ị na-ejikarị ekwupụta ụdị echiche ndị a nye ndị nọ na ndụ gị?

Nkwupụta Okwu: Olee otú i cherè na kaadị gị ga-eme ka obi dị onye a? Gịnị mere i ji chee na iké dị ukwuu dị n'igosi mmadụ ịhụnanya?

Ahụmahụ: Jizọs degaara anyị akwụkwọ-ozi dị ezigbote ogologo nke a na-akpọ Akwụkwọ Nsọ iji gosipụta ịhụnanya Ya n'ebe anyị nọ. Kedụ ihe bụ akụkụ kacha baa uru na akwụkwọ-ozi Ya nye gị?
Ụbọchị 13Ụbọchị 15

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Rediscovering the Christmas Season

Malite ihe omume Ekeresimesi dị ọhụrụ site n'ime ihe n'ụzọ n'abụghị otu esi emebu ya n'oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa. Ụbọchị mmalite dị́ mma maka ihe omume a bụ Disemba 1, ebe mmalite dị ọsọ karịa ụbọchị a n'enye ohere ime ya n'ụzọ n'adịghị enye nsogbu. Ihe omume a gụnyerè ajụjụ ntụgharị uche gasị na ihe ndị aga-eme n'usoro iji kwụwa kwa ụbọchị chịm na Kraịst. Ihe omume a marà ezigbo mma maka ndị mmadụ ime ya n'otu n'otu, ezinụlọ imekọta ya, ma ọ bụ obere otù gasị imekọta ya.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka mmesapụ aka ha n'inye usoro ọgụgụ maka atụmatụ ihe ọgụgụ bụ "Rediscovering the Christmas Season". Iji mụtakwuo gbasara Life.Church, gaa na webụsaịtị ha na www.life.church