Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ịchọpụtagharị Ịma Mma Nke Oge EkeresimesiIhe Atụ

Rediscovering the Christmas Season

ỤBỌCHỊ 16 NKE 25

Ọmụmụ Jizọs

Nkpughe: Gụọ banyere ndị eze bịara ife Jizọs òfùfè. Lee anya na ngwóngwó na ihe ndị eji mee ihe ngosi ọmụmụ Jizọs wee tụlee ihe ndị onye mere ya jiri n'egosi na ihe ị n'ele anya bụ hoohaa maka Kraịst.

Mkpaghari Uche: Kedụ otu ị chere na ọ ga-adị gị ịnọ kpọmkwem n'ime ihe ị n'ele anya, n'oge ọ n'eme? Kedụ otu ị ga-esi nọrọ ma ọ bụ debe onwe gị n'ebe ahụ?

Nkwupụta Okwu: Ndị nwoke-amamihe ahụ fere Jizọs òfùfè site n'igbu ikpere n’ala. Gbuo ikpere n'ala ma gwa Ya ugbu a otú ị siri hụ Ya n'anya. Olee otú naanị ịnọ n'ọnọdụ ahụ si wee gbanwee ọnọdụ ime obi gị?

Ahụmahụ: Ndị nwoke-amamihe ahụ fekwara Jizọs òfùfè site n'inye onyinye ha kacha mma. Chee echiche banyere ụzọ ịga esi fee Jizọs òfùfè taa na-agụnyeghị́ ịgụ egwú ma ọ bụ ịbụ abụ.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 15Ụbọchị 17

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Rediscovering the Christmas Season

Malite ihe omume Ekeresimesi dị ọhụrụ site n'ime ihe n'ụzọ n'abụghị otu esi emebu ya n'oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa. Ụbọchị mmalite dị́ mma maka ihe omume a bụ Disemba 1, ebe mmalite dị ọsọ karịa ụbọchị a n'enye ohere ime ya n'ụzọ n'adịghị enye nsogbu. Ihe omume a gụnyerè ajụjụ ntụgharị uche gasị na ihe ndị aga-eme n'usoro iji kwụwa kwa ụbọchị chịm na Kraịst. Ihe omume a marà ezigbo mma maka ndị mmadụ ime ya n'otu n'otu, ezinụlọ imekọta ya, ma ọ bụ obere otù gasị imekọta ya.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka mmesapụ aka ha n'inye usoro ọgụgụ maka atụmatụ ihe ọgụgụ bụ "Rediscovering the Christmas Season". Iji mụtakwuo gbasara Life.Church, gaa na webụsaịtị ha na www.life.church