Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ịchọpụtagharị Ịma Mma Nke Oge EkeresimesiIhe Atụ

Rediscovering the Christmas Season

ỤBỌCHỊ 20 NKE 25

Okwu Ahu

Nkpughe: Gụọ isiakwụkwọ nke mbụ nke akụkọ Jọn Onyeozi banyere ndụ Jizọs. Ọ bụrụ na ịmere ihe ngwakọta flawa ịchọ mma nke Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa, wepụta oge naanị iji nọrọ jụụ wee n'atụgharị uche kà ị n'elekwasị anya na ọkụ si na kandụl acha.

Mkpaghari Uche: Amaara isiakwụkwọ a dịka nke e dere n'ụzọ dị omimi omimi ma ya ana-enye nkọwa otu Chineke si kwadoo ụwa maka ọbịbịa nke Okwu Ya. Kedụ akụkụ kachasị masị gị na isiakwụkwọ a?

Nkwupụta Okwu: Kedụ ihe dị ezigbo mkpa gbasara ịghọta na Jizọs bụ Okwu Ahụ nakwa na Ọ bụ Chineke tupu enwee ihe ọbụla dịka mmalite?

Ahụmahụ: “Soro M” bụ okwu ị na-ahụ na Jọn 1. Kedụ otu ọ dị gị mgbe Jizọs gwara gị ka i soro Ya?

Okwu Chukwu

Ụbọchị 19Ụbọchị 21

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Rediscovering the Christmas Season

Malite ihe omume Ekeresimesi dị ọhụrụ site n'ime ihe n'ụzọ n'abụghị otu esi emebu ya n'oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa. Ụbọchị mmalite dị́ mma maka ihe omume a bụ Disemba 1, ebe mmalite dị ọsọ karịa ụbọchị a n'enye ohere ime ya n'ụzọ n'adịghị enye nsogbu. Ihe omume a gụnyerè ajụjụ ntụgharị uche gasị na ihe ndị aga-eme n'usoro iji kwụwa kwa ụbọchị chịm na Kraịst. Ihe omume a marà ezigbo mma maka ndị mmadụ ime ya n'otu n'otu, ezinụlọ imekọta ya, ma ọ bụ obere otù gasị imekọta ya.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka mmesapụ aka ha n'inye usoro ọgụgụ maka atụmatụ ihe ọgụgụ bụ "Rediscovering the Christmas Season". Iji mụtakwuo gbasara Life.Church, gaa na webụsaịtị ha na www.life.church