Ịchọpụtagharị Ịma Mma Nke Oge EkeresimesiIhe Atụ
Ọ Na-abịa
Nkpughe: Gụọ ụfọdụ ilu Jizọs tụrụ banyere mgbe Ọ ga-alọghachi.
Mkpaghari Uche: Gịnị ka i cherè bụ isi ihe nke isiakwụkwọ a? I meela ọtụtụ ihe iji jikere maka Ekeresimesi. Kedụ ihe ị ga-eme ka ị dị njikere maka Ọbịbịa Jizọs nke Abụọ?
Nkwupụta Okwu: Olee otú ị si na-akwado maka nloghachi nke Jizọs? Gị na ndị enyi gị na ndị ezinụlọ gị kparịta ma ọ bụ gị detuo na nwa akwụkwọ gbasara ihe ị chọrọ ime iji dị njikere maka ụbọchị ahụ.
Ahụmahụ: Olee otú ndụ gị ga-esi dị iche taa ma ọ bụrụ na i kweere na Jizọs ga-alọghachi n'etiti abalị nke ụbọchị taa? Ọ bụrụ na o nwere ihe gbatara gị n'obi ị ga-eme dị iche, gaa mee ya ozugbo.

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Malite ihe omume Ekeresimesi dị ọhụrụ site n'ime ihe n'ụzọ n'abụghị otu esi emebu ya n'oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa. Ụbọchị mmalite dị́ mma maka ihe omume a bụ Disemba 1, ebe mmalite dị ọsọ karịa ụbọchị a n'enye ohere ime ya n'ụzọ n'adịghị enye nsogbu. Ihe omume a gụnyerè ajụjụ ntụgharị uche gasị na ihe ndị aga-eme n'usoro iji kwụwa kwa ụbọchị chịm na Kraịst. Ihe omume a marà ezigbo mma maka ndị mmadụ ime ya n'otu n'otu, ezinụlọ imekọta ya, ma ọ bụ obere otù gasị imekọta ya.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka mmesapụ aka ha n'inye usoro ọgụgụ maka atụmatụ ihe ọgụgụ bụ "Rediscovering the Christmas Season". Iji mụtakwuo gbasara Life.Church, gaa na webụsaịtị ha na www.life.church