Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ịchọpụtagharị Ịma Mma Nke Oge EkeresimesiIhe Atụ

Rediscovering the Christmas Season

ỤBỌCHỊ 24 NKE 25

A Hụrụ N'anya Nke Ukwuu

Nkpughe: Ụbọchị ga-abọ Ekeresimesi bụ ụbọchị ikpeazụ nke Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa. Otu amaokwu kwurù okwu gbasara ya n'ụzọ juru eju. Gụọ Jọn 3:16. Mee nnukwu posta ma ọ bụ akwụkwọ mmado bụrụ ezigbo ibù nke Jọn 3:16 dị ka ị n'ahụ na mmemme egwuregwu ma ọ bụ n'ámá egwuregwu wee dobe ya n'èzí ụlọ gị.

Mkpaghari Uche: Ọ̀ dị gị ka a hụrụ gị n'anya nke ukwuu ụbọchị taa?

Nkwupụta Okwu: Kwupụta amaokwu a n'olu dara ụda. Buru ya n'isi ma ọbụrụ na i mebeghị ya. Kedụ ihe bụ oge kachasị dị gị mkpa na maa gị ezigbo mma ịbụ onye n'eso ụzọ Jizọs? Kedụ oge kachasị dị gị njọ ma ọ bụ taa gị ahụhụ ịbụ onye n'eso ụzọ Jizọs?

Ahụmahụ: Tụgharịa uche n'ahụmahụ gị gasị n'oge Ekeresimesi a. Gị na ndị enyi gị na ndị ezinụlọ gị gaa ihe ụka òfùfè nke ụbọchị ga-abọ Ekeresimesi.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 23Ụbọchị 25

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Rediscovering the Christmas Season

Malite ihe omume Ekeresimesi dị ọhụrụ site n'ime ihe n'ụzọ n'abụghị otu esi emebu ya n'oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa. Ụbọchị mmalite dị́ mma maka ihe omume a bụ Disemba 1, ebe mmalite dị ọsọ karịa ụbọchị a n'enye ohere ime ya n'ụzọ n'adịghị enye nsogbu. Ihe omume a gụnyerè ajụjụ ntụgharị uche gasị na ihe ndị aga-eme n'usoro iji kwụwa kwa ụbọchị chịm na Kraịst. Ihe omume a marà ezigbo mma maka ndị mmadụ ime ya n'otu n'otu, ezinụlọ imekọta ya, ma ọ bụ obere otù gasị imekọta ya.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka mmesapụ aka ha n'inye usoro ọgụgụ maka atụmatụ ihe ọgụgụ bụ "Rediscovering the Christmas Season". Iji mụtakwuo gbasara Life.Church, gaa na webụsaịtị ha na www.life.church