Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ịchọpụtagharị Ịma Mma Nke Oge EkeresimesiIhe Nhụchatụ

Rediscovering the Christmas Season

ỤBỌCHỊ 22 NKE 25

Ọṅụ

Nkpughe: Gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ sitere na Abụ Ọma. Kpọkọta ụfọdụ ndị enyi gị wee mee njegharí ọgụgụ egwú Ekeresimesi. Ọ bụrụ na ịmaghị mkpụrụokwu niile nke egwú ndị ị chọrọ ịgụ, bipụta ha n'ibé akwụkwọ gasị tupu ị pụọ. Ị nwere ike ijeghari n'ebe ibi ma ọ bụ gị gaghachi hụ otu n'ime ndị ị zutere n'ọnwa a ka ị n'ezi oziọma.

Mkpaghari Uche: Kedụ ka ndị mmadụ si mee omume ma ọ bụ kwuo okwu maka egwú Ekeresimesi gị na ndị enyi gị gụrụ? Kedụ egwú Ekeresimesi kacha amasị gị? Gịnị mere ọ ji bụrụ nke kacha amasị gị?

Nkwupụta Okwu: Jiri aka gị detuo n'akwụkwọ okwu egwú Ekeresimesi kacha amasị gị. Rịọ Chineke ka O were oge a nyere gị aka inwe ahụmahụ ọṅụ na udo nke egwú a na-ekwu, n'ụzọ dị ọhụrụ, n'afọ a.

Ahụmahụ: Gịnị bụ ihe ncheta kachasị atọ gị ụtọ gbasara agụmagụ nke egwú Ekeresimesi?

Okwu Chukwu

Ụbọchị 21Ụbọchị 23

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Rediscovering the Christmas Season

Malite ihe omume Ekeresimesi dị ọhụrụ site n'ime ihe n'ụzọ n'abụghị otu esi emebu ya n'oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa. Ụbọchị mmalite dị́ mma maka ihe omume a bụ Disemba 1, ebe mmalite dị ọsọ karịa ụbọchị a n'enye ohere ime ya n'ụzọ n'adịghị enye nsogbu. Ihe omume a gụnyerè ajụjụ ntụgharị uche gasị na ihe ndị aga-eme n'usoro iji kwụwa kwa ụbọchị chịm na Kraịst. Ihe omume a marà ezigbo mma maka ndị mmadụ ime ya n'otu n'otu, ezinụlọ imekọta ya, ma ọ bụ obere otù gasị imekọta ya.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka mmesapụ aka ha n'inye usoro ọgụgụ maka atụmatụ ihe ọgụgụ bụ "Rediscovering the Christmas Season". Iji mụtakwuo gbasara Life.Church, gaa na webụsaịtị ha na www.life.church