Ịchọpụtagharị Ịma Mma Nke Oge EkeresimesiIhe Atụ
Nke Kacha Nta N'ime Ndị A
Nkpughe: Gụọ ihe Jizọs kụziri banyere ikpe ikpeazụ. Chee echiche banyere onye ị maara nke nwere ike ịdaba na mpaghara nke "nke kacha nta n'ime ndị a." Tulaa uche gị na ndị gị na ha n'adịghị akpakọrịta. Kpọọ ha ka gị na ha rikọọ nri. Gee ha ntị n'olu na mara gbasara ha. Kpeera ha ekpere.
Mkpaghari Uche: Olee otú ị ga-esi na-emeso ndị mmadụ ihe n’ụzọ dị iche ma ọ bụrụ na ị hụrụ Jizọs n’ihu ha n'ezie? Kedụ mgbanwe ụfọdụ ị nwere ike ime na ndụ gị nke ga-adaba n'ụdị gị ịbụ nwa atụrụ?
Nkwupụta Okwu: Dee aha onye ahụ gị na ya rikọrọ nri na akwụkwọ nyapade wee mapawa ya ebe ị ga n'ahụ ya kwa ụbọchị. Malite ikpere ha ekpere mgbe niile. Meghee obi gị n'eché ka Chineke ga-esi si gị nyekwuoro ha aka.
Ahụmahụ: Gịnị ka ị mụtara na mmekọrịta gị na onye i kpọbatara n'ụlọ gị? Olee otú ndụ gị ga-esi dị iche ma ọ bụrụ na i kpacha anya wee n'ewepụta oge ka gị na ndị ụwa n'atà ahụhụ na-anọkọ́?

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Malite ihe omume Ekeresimesi dị ọhụrụ site n'ime ihe n'ụzọ n'abụghị otu esi emebu ya n'oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa. Ụbọchị mmalite dị́ mma maka ihe omume a bụ Disemba 1, ebe mmalite dị ọsọ karịa ụbọchị a n'enye ohere ime ya n'ụzọ n'adịghị enye nsogbu. Ihe omume a gụnyerè ajụjụ ntụgharị uche gasị na ihe ndị aga-eme n'usoro iji kwụwa kwa ụbọchị chịm na Kraịst. Ihe omume a marà ezigbo mma maka ndị mmadụ ime ya n'otu n'otu, ezinụlọ imekọta ya, ma ọ bụ obere otù gasị imekọta ya.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka mmesapụ aka ha n'inye usoro ọgụgụ maka atụmatụ ihe ọgụgụ bụ "Rediscovering the Christmas Season". Iji mụtakwuo gbasara Life.Church, gaa na webụsaịtị ha na www.life.church