Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ịchọpụtagharị Ịma Mma Nke Oge EkeresimesiIhe Atụ

Rediscovering the Christmas Season

ỤBỌCHỊ 6 NKE 25

Onyinye

Nkpughe: Gụọ amaokwu ndị a n'ekwu gbasara inye ihe. Gaa zụọ ahịa Ekeresimesi maka onye na-abụghị akụkụ nke ezinụlọ gị dị́ ka onye ọrịa nọ n'ebe a na-elekọta ndị agadi ma ọ bụ n'ụlọ ọgwụ, onye na-ewetara gị akwụkwọ-ozi gị, onye na-ekpofuru gị ihe, ma ọ bụ nwa si n'ezi a na-azụlite.

Mkpaghari Uche: Gịnị bụ isi ihe inye onyinye? Kedụ ka Jizọs si bụrụ onyinye kachasị mma ị nwetụrụlà?

Nkwupụta Okwu: Kedụ ka ị si dị mmesapụ aka n'inye oge gị, akụ gị na nkà gị? Ị na-ebi ndụ n'egosi na n'ezie inye ihe karịrị ịnara anara? Kedụ ka ị ga-esi bie ndụ a nke ọma n'oge Ekeresimesi a?

Ahụmahụ: Gị na ndị enyi gị ma ọ bụ ezinụlọ gị kparịta ma ọ bụ gị detuo na nwa akwụkwọ banyere oge ị jirila oke mmesapụ aka gọzie mmadụ ma ọ bụ oge onye ọzọ jirila oke mmesapụ aka gọzie gị. Wepụta oge kpee ezigbo ekpere na-arịọ Chineke ka O nyere gị aka ka ị dịkwuo mmesapụ aka site n'ịghọta nke ọma onyinye ịhụnanya O nyere anyị.
Ụbọchị 5Ụbọchị 7

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Rediscovering the Christmas Season

Malite ihe omume Ekeresimesi dị ọhụrụ site n'ime ihe n'ụzọ n'abụghị otu esi emebu ya n'oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa. Ụbọchị mmalite dị́ mma maka ihe omume a bụ Disemba 1, ebe mmalite dị ọsọ karịa ụbọchị a n'enye ohere ime ya n'ụzọ n'adịghị enye nsogbu. Ihe omume a gụnyerè ajụjụ ntụgharị uche gasị na ihe ndị aga-eme n'usoro iji kwụwa kwa ụbọchị chịm na Kraịst. Ihe omume a marà ezigbo mma maka ndị mmadụ ime ya n'otu n'otu, ezinụlọ imekọta ya, ma ọ bụ obere otù gasị imekọta ya.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka mmesapụ aka ha n'inye usoro ọgụgụ maka atụmatụ ihe ọgụgụ bụ "Rediscovering the Christmas Season". Iji mụtakwuo gbasara Life.Church, gaa na webụsaịtị ha na www.life.church