Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ịchọpụtagharị Ịma Mma Nke Oge EkeresimesiIhe Atụ

Rediscovering the Christmas Season

ỤBỌCHỊ 5 NKE 25

Ọkụ Gasị

Nkpughe: Gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a n'ekwu gbasara Jizọs ịbụ ìhè. Mee nyocha gbasara mmalite nke ememe itinye ọkụ Ekeresimesi. Gị na ndị enyi gị ma ọ bụ ezinụlọ gị jiri ụgbọala nyagharịa n'obodo wee lelee ngosipụta dị iche iche nke ọkụ Ekeresimesi.

Mkpaghari Uche: Kedụ ka Jizọs si bụrụ ìhè nke ụwa? Tụlee ihe ndị ị maara bụ eziokwu gbasara ọkụ sayensị n'ekwu. N’ụzọ dị aṅaa gasị ka ìhè si bụrụ ihe atụ zuru okè nke Chineke kere site ná mmalite iji gosipụta nke ọma onye Jizọs bụ?

Nkwupụta Okwu: Gịnị mere i ji chee na Jizọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ Ya ìhè nke ụwa? Kedụ ihe nke ahụ ga-apụta na ndụ gị ma ị bụrụ ìhè ná mmekọrịta gị gasị na ọnọdụ gị niile?

Ahụmahụ: Olee otú ndụ gị si bụrụ ìhè nye ndị gbara gị gburugburu? Gbaa mbọ hụ na ị bụ ìhè n'oge a.
Ụbọchị 4Ụbọchị 6

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Rediscovering the Christmas Season

Malite ihe omume Ekeresimesi dị ọhụrụ site n'ime ihe n'ụzọ n'abụghị otu esi emebu ya n'oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa. Ụbọchị mmalite dị́ mma maka ihe omume a bụ Disemba 1, ebe mmalite dị ọsọ karịa ụbọchị a n'enye ohere ime ya n'ụzọ n'adịghị enye nsogbu. Ihe omume a gụnyerè ajụjụ ntụgharị uche gasị na ihe ndị aga-eme n'usoro iji kwụwa kwa ụbọchị chịm na Kraịst. Ihe omume a marà ezigbo mma maka ndị mmadụ ime ya n'otu n'otu, ezinụlọ imekọta ya, ma ọ bụ obere otù gasị imekọta ya.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka mmesapụ aka ha n'inye usoro ọgụgụ maka atụmatụ ihe ọgụgụ bụ "Rediscovering the Christmas Season". Iji mụtakwuo gbasara Life.Church, gaa na webụsaịtị ha na www.life.church