Ịchọpụtagharị Ịma Mma Nke Oge EkeresimesiIhe Atụ
Ohù Mmadụ Niile
Nkpughe: Gụọ ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ Ya banyere ịbụ ohu. N'ime awa iri abụọ na anọ n'esote, bie ndụ n'ụzọ dị otu a site n'ijere mmadụ ozi. Nke ka mkpa, chee echiche otú ị ga-esi anabata nwatakịrị n'aha Jizọs.
Mkpaghari Uche: Gịnị mere i ji chee na Jizọs kuurù nwatakịrị n'aka Ya mgbe Ọ n'ekwu okwu a? Gịnị ka nke a n'egosipụta banyere ministrị Jizọs na otu nwatakịrị nọworị nsọ?
Nkwupụta Okwu: Onye ka ị che na a gọziri karịa? Gị bụ onye n'eje ozi ka ọ bụ ndị ị n'ejere ozi?
Ahụmahụ: Detuo na nwa akwụkwọ otú i si eme ihe ma n'ebị ndụ n'ụbọchị gị gasị. Ndụ gị o jupụtara na gị ijere mmadụ ibe gị ozi ka ọ bụ na ana-ejere gị ozi? Ọ̀ dị ihe n'adị iche n'ime ha abụọ n'oge Ekeresimesi?

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Malite ihe omume Ekeresimesi dị ọhụrụ site n'ime ihe n'ụzọ n'abụghị otu esi emebu ya n'oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa. Ụbọchị mmalite dị́ mma maka ihe omume a bụ Disemba 1, ebe mmalite dị ọsọ karịa ụbọchị a n'enye ohere ime ya n'ụzọ n'adịghị enye nsogbu. Ihe omume a gụnyerè ajụjụ ntụgharị uche gasị na ihe ndị aga-eme n'usoro iji kwụwa kwa ụbọchị chịm na Kraịst. Ihe omume a marà ezigbo mma maka ndị mmadụ ime ya n'otu n'otu, ezinụlọ imekọta ya, ma ọ bụ obere otù gasị imekọta ya.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka mmesapụ aka ha n'inye usoro ọgụgụ maka atụmatụ ihe ọgụgụ bụ "Rediscovering the Christmas Season". Iji mụtakwuo gbasara Life.Church, gaa na webụsaịtị ha na www.life.church