Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka ỤmụakaIhe Atụ

Children's Advent House

ỤBỌCHỊ 1 NKE 25

Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka Ụmụaka

Sitere na: Tara Davis

Ụtọ Ekeresimesi dirí unu ndị enyi m ọma! Unù na-achọ ihe omume amụma-ọkwa-ọbịbịa nke gbadoro ụkwụ na Kraịst unu na ụmụ unu ga-eme? Unu echegbụzila onwe unu maka nke ahụ! Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa a emebere maka ụmụaka ga-atụnye eziokwu na ịma mma na ndụ ụmụ gị kwa ụbọchị nke ememe Amụma Ọkwa Ọbịbịa a!

Ị nwere ike ime nke a ka ọ dị mfe ma ọ bụ jupụta n'ihe dị ka ọ ga-amasị gị, naanị chọọ ihu Onye-nwe-anyị maka ihe Ọ chọrọ ka ị mee oge Ekeresimesi a! Ụbọchị ọ bụla nke Amụma Ọkwa Ọbịbịa a ga-enwe akụkụ Akwụkwọ Nsọ ị ga-agụ yana obere foto nwa gị ga-eji agba chọọ mma n'ime "ụlọ" ya. 

*Ị nwere ike ibipụta ụlọ ahụ nwa gị ga-eji agba chọọ mma na njedebe nke agụmagụ ihe òfùfè nke taa. 

Anyị maara na unu bụ ndị nne n'enweghị ohere n'ihi ọrụ unu n'arụ, ya mere anyị jiri nye ụbọchị abụọ dị efu kwa izu nweré windo ma ọ bụ ọnụ-ụzọ n'enweghị ihe dị na ya maka nwa gị ka o jiri agba chọọ ya mma. Were ụbọchị ndị a dị efu wee gụọ na mee ihe niile i na-emeghị n'ụbọchị ndị gara aga, mgbe ọ bụla i jiri chọọ ha. Anyị tinyekwara Amaokwu gasị dị mfe na ekpere maka gị n'ụbọchị ndị a dị efu iji nyere obi nke gị aka dị nlekwasị-anya na Jizọs n'Ekeresimesi a.

N'ọgwụgwụ nke agụmagụ ihe òfùfè ụbọchị ọ bụla, enwere ihe omume dị nhọrọ ị nwere ike ime iji tinyekwuo Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ị gụrụ n'ọrụ. Mee nnukwu ihe ma ọ bụ nwa obere ihe gbasara ihe omume a ka o si masị gị! Ugbu a, ka anyị gaa n'ihu ná nkwadebe na-atọ ụtọ!

Nkwadebe: Anyị na-amazi ikwado ihe ndị a maka idi njikere ime ihe omume a dị ụtọ. Ka m kwuo ya ọzọ, mee ihe omume a ka ọ bụrụ nke gị site n'ime nnukwu ma ọ bụ obere dị ka ohere gị siri dị!

1. Bipụta akwụkwọ Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka Ụmụaka dị peeji abụọ maka ụmụ gị ọ bụla (i ga-achọta ya na njedebe nke agụmagụ ihe òfùfè nke taa).

2. Chịkọta ihe ndị eji ese ihe ma ọ bụ kreyọn gasị maka nwa gị ka ọ ji ha dee akwụkwọ ahụ ibipụtara agba kwa ụbọchị.

3. Zụta akpa swiitị ka ị nwee ike isi na ya n'enye nwa gị ihe ụtọ nwa obere nwa obere kwa ụbọchị ka gị na ya n'agụ amaokwu e wepụtara kwa ụbọchị. Okwu Chineke dị ka mmanụ aṅụ n’egbugbere ọnụ anyị, ya mere nye nwa gị ihe itọ́-ụtọ nke Akwụkwọ Nsọ n'Ekeresimesi a! (Abụ Ọma 119:103)

4. Lezuo ihe omume niile asi ka e mee n'ụbọchị niile wee jiri obi mara ndị i chọrọ ime, na ndị ọ dị mkpa ka i chịkọtakwuo ihe banyere ha.

5. Ugbu a ị dịla njikere ibido!

Gụọ Ihe: Na Disemba 1st (ma ọ bụ ụbọchị gara aga ma ọ bụrụ na ụdị nke a ga-amasị gị), gụọrọ nwa gị mpaghara mmeghe ndị a:

Taa bụ ụbọchị ahụ a kara aka! Ụbọchị mbụ nke Amụma Ọkwa Ọbịbịa! Ị̀ nwerè ike ikwere na oge Ekeresimesi abịaruola nso? Nke a bụ oge dị ọpụrụ-ichè nke afọ! Ị hụtụbela ụlọ Ekeresimesi e jiri gingerbread wuo, e jirí ihe ụtọ dị iche iche chọọ ya mma, shuga dị na ya ana-eme ka ọ n'egbuke egbuke ma n'achawanye n'ihi obi ụtọ niile nke Ekeresimesi? Mkpụrụ obi anyị dịkwa ka ụlọ, nnukwu ụlọ nwere ọtụtụ ọnụ-ụlọ n'ime ya. Mana ọnụ-ụlọ nke ọ bụla n'ime ụlọ anyị tọgbọrọ chakoo, na-eche ka emejupụta ya, ọ kwanú gị ka ọ dịịra ikpebi otu ị ga-esi mejupụta ha!

Ugbu a ka m gwa gị banyere Nna gị nke eluigwe, Onye kasị dị ịtụnanya, hụrụ́ gị n'anya nke ukwuu! Ọ hụrụ gị n'anya nke ukwuu izite Ọkpara Ya ka Ọ bịa napụta gị na mmehie gị ma n'akpọ gị òkù iso Jizọs ka gị na Ya bie ndụ n'ebighị ebi! Nna a dị ịhụnanya chọrọ ka i were akụ Ya mara mma mejupụta ọnụ-ụlọ niile dị n’ụlọ gị. Ilu 24:3-4 na-agwa anyị na “Site n’amamihe ka e ji ewu ụlọ, sitekwa n’ihe ọmụma, ka e ji emejupụta ime ụlọ jiri akụ ndị dị oké ọnụ ahịa na nke mara mma.” Iji mejuo ime-ụlọ nile nke ụlọ-gị jiri àkù nke Onye-nwe-anyị, ọ dị mkpa ka i chọọ amamihe! Ma elee ebe i che na apụrụ ịchọta amamihe? Ọ bụ n'ime Akwụkwọ Nsọ! Ka ị na-agụ Okwu Chineke, akwụkwọ-ozi ịhụnanya Ya nye gị, ị ga n'ejupụta ọnụ-ụlọ nke ọ bụla n'ime ụlọ nke mkpụrụ obi gị na akụ kacha mma a pụrụ ichetụ n'echiche! Akụ ndị n'egbuke egbuke jiri ịhụnanya, ọṅụ, udo, ndidi, obi ọma, ịdị mma na okwukwe!

Ekeresimesi a, ọbụna na onyinye na ihe ịchọ mma niile nke ya n'adó gị n'anya ma n'obi, achọrọ m ịgba gị ume ka ị chọọ Jizọs ma mụta ịhụ Okwu Ya n'anya! Jizọs hụrụ gị n'anya nke ukwuu, ị bụ nwa Ya dị oké ọnụ ahịa ma ya abụrụ agụụ nke obi Ya ka ị chọọ ihe Ya na ihu Ya n'Ekeresimesi a na n'ụbọchị ọbụla n'ime afọ a! Ya mere, ụbọchị ọ bụla n'ime ụbọchị iri abụọ na ise n'esote, anyị ga-agụ okwu ole na ole sitere na Akwụkwọ Nsọ ma ị nwere ike iji agba chọọ otu n'ime ọnụ-ụlọ Ekeresimesi gị mma. Ime ụlọ gị ndị ahụ niile jupụtara na ezigbo akụ̀ Ekeresimesi! Ka ị n'eji agba achọ foto nke ọ bụla mma, achọrọ m ka ị chee echiche banyere ịhụnanya Chineke nwere n'ebe ị nọ na otú O si nwee ọtụtụ akụ̀ dị ịtụnanya dị nchekwa n'eche ka ị chọta ha n'ime Ya!

Ntụziaka Maka Ihe A Ga-eme:

Ụbọchị Mbụ: Gụọ Mkpughe 5:11-13 

Nke a nwere ike ịdị ka ebe a n'ekwesịghị ịmalite akụkọ Ekeresimesi, mana ọ bụ n'ezie ebe kacha mma isi malite! Site n’oge nke Ogige Iden mgbe mmehie banyere n’ụwa ruo ugbu a, ọ dịbeghị onye pụrụ ịzọpụta anyị ná mmehie anyị na n’ọnwụ. Onye-Nnapụta dị anyị ezigbo mkpa! Anyị chọrọ ka Chineke mee ka anyị laghachi azụ n'ezi mmekọrịta nke anyị na Ya. Mana Chineke hụrụ̀ anyị n’anya nke ukwuu nke na Ọ nwererị atụmatụ ịzọpụta anyị! Ọ bịara n’ụwa dị ka nwa a mụrụ ọhụrụ, dị ka nwa atụrụ nke zuru okè, nke dị oké ọnụ ahịa. O tolitere ghọọ nwoke tozuru etozu, nwoke nke n'emeghị otu mkpụrụ ihe ọjọọ ma nye ndụ Ya maka anyị ka o nwee ike ikwe omume ka mkpụrụ obi anyị, nke n'eme ka anyị bụrụ ndị anyị bụ̀, na Ya bikọọ́ ndụ n'ebighị ebi, ọbụna mgbe ahụ anyị nwụsịrị. N'amaokwu ndị a anyị gụsịrị ugbu a, ndị mmụọ ozi na ihe ndị ọzọ e kere eke n'eto Jizọs, na-abụ abụ na Ọ bụ Chineke na ọ bụ naanị Ya kwesịrị ịnata nsọpụrụ, otuto, ike, na ume ruo ebighị-ebi kwa ebighị-ebi. Ugbu a, nke ahụ bụ ihe Ekeresimesi bụ maka ya! Anyị, dị ka ndị mmụọ ozi, ka e nyere ohere ibi ndụ n'ebumnobi nke ịhụ Jizọs n'anya na ijere Ya ozi! Lee akụ̀ dị oké ọnụ ahịa e nyeworo anyị! Ka anyị n'amụ̀ maka akụkọ Ekeresimesi n'ime izu ole na ole sochirinụ, buru n'uche na nke a abụghị naanị akụkọ a kọrọ, kama ọ bụ onyinye ga-agbanwe ndụ gị niile!

Ihe Omume: Chee echiche banyere onyinye ị ga-achọ inye Jizọs n'Ekeresimesi a. O nwere ike ịbụ ịgwa Ya okwu karịa ka i n'eme, iwepụta onwe gị n'agụ Akwụkwọ Nsọ wee n'amụtakwu ihe banyere Ya, iji obiọma n'emeso ụmụnne gị na ụmụnna gị ihe, ịgwa ndị ọzọ banyere Jizọs, inwe obi jupụtara n'ekele, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ! Chọta igbe ma ọ bụ akpa gị dị ochie wee chọọ ya mma ka ọ bụrụ igbe-onyinye gị banyere ihe ọma ahụ ịchọrọ inye Jizọs. N'ime ụbọchị ole na ole sochirinụ, mgbe ị kpebicharà ihe ịchọrọ inye Jizọs ka onyinye, dee ya edee n'akwụkwọ, tinye ya n'igbe ahụ ma gwa Jizọs okwu banyere ya. Mee ka Onye-nwe-anyị mara ka ị si chọọ ichuso Ya ma bịarukwuo Ya nso n'Ekeresimesi a!

**Pịa ebe a ka ibipụta peeji akwụkwọ abụọ ahụ aga-eji agba chọọ mma nke "Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka Ụmụaka"!


Okwu Chukwu

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Children's Advent House

Ezigbo Nne, ọ na-adị gị ka oge Ekeresimesi ji ọsọ na ọgbaghara n'agabiga gị? Afọ a pụrụ ịdị iche. Ka gị na ụmụ gị chọpụta akụ nke ịhụnanya Kraịst n'Ekeresimesi a! Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka Ụmụaka bụ ọmarịcha agụmagụ ihe òfùfè dị ụbọchị iri abụọ na ise, zuru ezù, nwere akwụkwọ ihe omume ịga ebipụta nke ga-enyere aka tụzie obi ụmụ gị n'ebe Onye-nwe-anyị nọ ma mee ka oge Ekeresimesi a bụrụ ihe bara uru nye gị!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Help Club for Moms maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://helpclubformoms.com