Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka ỤmụakaIhe Atụ
Ụbọchị Nke Anọ: Gụọ Aịzaya 7:14
Immanuel pụtara “Chineke nọnyeere anyị.” Ị̀ pụrụ ikwere na ihe karịrị afọ 700 tupu a mụọ Jizọs, Chineke zipụrụ onye amụma ka ọ gwa ndị mmadụ na Ọ ga-ezite Onye Nnapụta, bụ́ Chineke n’ụdị mmadụ, ịzọpụta ndị nile hụrụ Ya n’anya? Chineke nọ n'eme atụmatụ inapụta gị kemgbe mmehie banyere n'ụwa! Ọ hụrụ gị n'anya nke ukwuu!
Ihe Omume: Na mpempe akwụkwọ, jiri ihe odide n'adịghị ehichapụ ehichapụ, dee Immanuel n'asụsụ Hibru (צּמּנוּאַל) na ihe ọ pụtara, "Chineke nọnyeere anyị." Ọ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị-ebi! Jiri ihe agba dị n'ụdị mmiri ma ọ bụ ihe osise ọbụla dị mma chọọ ya mma!
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ezigbo Nne, ọ na-adị gị ka oge Ekeresimesi ji ọsọ na ọgbaghara n'agabiga gị? Afọ a pụrụ ịdị iche. Ka gị na ụmụ gị chọpụta akụ nke ịhụnanya Kraịst n'Ekeresimesi a! Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka Ụmụaka bụ ọmarịcha agụmagụ ihe òfùfè dị ụbọchị iri abụọ na ise, zuru ezù, nwere akwụkwọ ihe omume ịga ebipụta nke ga-enyere aka tụzie obi ụmụ gị n'ebe Onye-nwe-anyị nọ ma mee ka oge Ekeresimesi a bụrụ ihe bara uru nye gị!
More