Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka ỤmụakaIhe Atụ
Ụbọchị Nke Iri Abụọ Na Ise: Gụọ Matiu 2:1-12
Ndị Nwoke-amamihe ahụ chọrọ Jizọs n’ihi na ọ bụ agụụ nke obi ha inye Ya òfùfè! Ị̀ chọrọ ibi ndụ dịka ndị nwoke-amamihe ahụ mere: inye ihe niile na iga njem dị anya naanị maka ife Onye-Nzọpụta anyị bụ Jizọs òfùfè? Ama m na m chọrọ ime nke ahụ!
Ihe Omume: Wepụta oge n'etiti ihe omume n'ekwo ekwo nke Ụbọchị Ekeresimesi iji fee Jizọs òfùfè, gị na ezinụlọ gị. Kọọnụ̀ akụkọ banyere Ya, kpekọọnụ ekpere ọnụ, bụọnụ abụ otuto, gụọnụ Okwu Ya...meenụ ihe ọbụla Chineke tinyere unu n'obi! Ọṅụ nke Ekeresimesi dirí unu! Ụbọchị a bụ ụbọchị magburu onwe ya iji mee ememe nke ịhụnanya Jizọs!
• Mmemme gasị dị́ nhọrọ ụmụ gị ndị toturu eto pụrụ ime:
Ụfọdụ n'ime ihe ndị e depụtara a n'eme eme kwa ụbọchị kacha mma maka ụmụ ndị dị ntakịrị. Ọ bụrụ na ị chọrọ itinye ihe ndị aga-eme eme n'ọnwa a maka ụmụ gị ndị toro eto, ụfọdụ ihe ndị ha pụrụ ime ga-enyé ha obi ụtọ dị n'okpuru!
1. Mee akwụkwọ akụkọ iji n'edebe ụfọdụ ihe ndị na-eme n’ime ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị. Ka ha nye akwụkwọ akụkọ ha aha mara mma dị ka “Bethlehem Times” ma tinye akụkọ, mgbasa ozi n'amụpụta ego, na ihe-atụ gasị n'ime ya dị ka o siri masị ha. Ha nwere ike ịna etinye ihe n'akwụkwọ akụkọ ha nwa obere nwa obere ka ihe sí n'akụkụ Akwụkwọ Nsọ siri tuó ha n'anya.
2. Dee abụ ma ọ bụ abụ otuto nye Onye-nwe-anyị. Nke a bụ ihe ha nwere ike ịrụ n’ime ọnwa ka Chineke na-etinye okwu otuto n’obi ha. Mgbe ha dechara abụ ma ọ bụ abụ otuto ha, si na kọmputa taipụpụta ihe ha dere wee tinye ya na fremụ ka ọ wuo mgbakwunye dị oké-ọnụ-ahịa nke ihe ịchọ mma ihe Ekeresimesi gị. Gị na ezinụlọ gị nwedịrị ike nwee abalị mmemme Ekeresimesi nke onye ọ bụla ga-egosipụta ihe ha mere ma ọ bụrụ na ị chọrọ ime otu a.
3. Mepụta ihe ejijé jiri ntụ ọka nwere nnu ma ọ bụ ihe a na-akpọ diorama n'ime igbe akpụkpọ-ụkwụ ma ọ bụ ihe eji ekpuchi igbe (enwere ọtụtụ ntụziaka maka etu esi eme ihe ntụ ọka nwere nnu na ịntanetị). Nwa gị nwere ike ime ya n’ụdị ihe ngosi nke Ọmụmụ Jizọs ma ọ bụ ikekwe maapụ nke njem Meri na Josef mere, ọbụna gụnyere ịgbaga Ijipt mgbe a mụsịrị Jizọs iji gbanarị Herọd. Hapụ ha ka ha kpụọ ihe ka ha si chọọ; ụbụrụ isi nke okike ha enweghị njedebe!
4. Mee ka nwa gị dee edemede a ga-eme ka ihe ejijé gbasara akụkọ ọmụmụ Jizọs. Dee ya n'ụdị skrịn-plé nke nwere akụkụ dị iche iche na ahịrị na-akpali mmasị. Nwa gị nwekwara ike ịme uwe na ngwóngwó eji eme yabụ ejijé!
5. Chịkọta ma jiri stepl gbado ọtụtụ ibe akwụkwọ ọnụ iji mee akwụkwọ Ekeresimesi na-akọwa akụkọ nke ọmụmụ Jizọs. Nwa gị nwere ike dee ma see ihe osise na ibe ọ bụla nke akwụkwọ a ma gụọ ya kwa afọ iji cheta ihe mere anyị ji agba Ekeresimesi!
Anyị nwere olileanya na atụmatụ ihe ọgụgụ a gbara gị ume! pịa njikọ a ka i nyochakwuo ihe aga-eme, mbipụta gasị, egwú gasị, na akụrụngwa gasị sitere na Help Club for Moms n'Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Amụma Ọkwa Ọbịbịa a.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ezigbo Nne, ọ na-adị gị ka oge Ekeresimesi ji ọsọ na ọgbaghara n'agabiga gị? Afọ a pụrụ ịdị iche. Ka gị na ụmụ gị chọpụta akụ nke ịhụnanya Kraịst n'Ekeresimesi a! Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka Ụmụaka bụ ọmarịcha agụmagụ ihe òfùfè dị ụbọchị iri abụọ na ise, zuru ezù, nwere akwụkwọ ihe omume ịga ebipụta nke ga-enyere aka tụzie obi ụmụ gị n'ebe Onye-nwe-anyị nọ ma mee ka oge Ekeresimesi a bụrụ ihe bara uru nye gị!
More