Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka ỤmụakaIhe Nhụchatụ

Ụbọchị Nke Iri Abụọ Na Asatọ: Gụọ Luk 2:8-15
Weregodị ya na ị tetara n’etiti abalị wee lelie anya gị elu wee hụ eluigwe jupụtara ná ndị mmụọ ozi n'eto Chineke! Ị̀ pụrụ ichetụ n'echiche otú ihe dị otu a pụrụ ịdị n'anya n'ele ya? Lee ihe ngosipụta mara mma nke otú anyị kwesịrị isi n'eto Chineke ruo mgbe ebighị ebi!
Ihe Omume: Rie ụdị nri Onye Ọzụzụ-Atụrụ n'eri ma mee ka ị bụ onye ọzụzụ-atụrụ n’abalị a mụrụ Jizọs!
*Hụ na i lelerè Ụbọchị Iri Abụọ Na Ise nke agụmagụ a ka ịhụ njikọ ga-eduga gị na ntụziaka gasị etu esi eme Nri Onye Ọzụzụ-Atụrụ na akụrụngwa ndị ọzọ maka atụmatụ ihe ọgụgụ a.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ezigbo Nne, ọ na-adị gị ka oge Ekeresimesi ji ọsọ na ọgbaghara n'agabiga gị? Afọ a pụrụ ịdị iche. Ka gị na ụmụ gị chọpụta akụ nke ịhụnanya Kraịst n'Ekeresimesi a! Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka Ụmụaka bụ ọmarịcha agụmagụ ihe òfùfè dị ụbọchị iri abụọ na ise, zuru ezù, nwere akwụkwọ ihe omume ịga ebipụta nke ga-enyere aka tụzie obi ụmụ gị n'ebe Onye-nwe-anyị nọ ma mee ka oge Ekeresimesi a bụrụ ihe bara uru nye gị!
More