Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka ỤmụakaIhe Atụ

Children's Advent House

ỤBỌCHỊ 21 NKE 25

Taa bụ ụbọchị ịgụ agụmagụ ihe òfùfè ọbụla i n'enweghị ohere ka gị na ụmụ gị gụọ na ịgba obi gị ume site n'Okwu Chineke!

    Gụọ Akwụkwọ Nsọ taa ma kpee ekpere ka Mmụọ Nsọ kwuo okwu n'obi gị. Ọ́ bụghị́ ihe magburu onwe ya ịmara na, dị ka Ndị Kraịst, anyị nwere nchebe nke ndụ ebighị ebi n'ime Jizọs? Ọ nwụrụ ọnwụ na-agbawa obi, ma bụkwasi Onwe Ya iwe Chineke niile n’obe ka e wee nwee ike ịgbaghara anyị, ka anyị dị nwere-onwe, na nwee obi ike na anyị na Ya ga-ebi ndụ n'ebighị ebi mgbe anyị nwụsịrị.
  • Kpee ekpere ma nyefee Chineke ụbọchị gị. Riọ Onye-nwe-anyị maka amamihe, ọmụma-ihe, ọmịiko, amara, ebere, ịhụnanya, na mgbaghara.
  • Kpee ekpere ma rịọ Jizọs ka O nyere gị aka ịhụ ezinụlọ gị na ndị mmadụ dị na ndụ gị n'anya, jirí ịhụnanya Ya n'ike nke Mmụọ Nsọ. Rịọ Ya ka O nyere gị aka ịnọkwu Jizọs nso ma dabere na Ya maka ihe niile ma ghara ịgbalị ime ihe ọ bụla n'onwe gị, yana okwukwe n'ịmara na Ọ ga-enyere gị aka imeri ihe ọ bụla ị na-eche ihu ugbu a ma ọ bụ n'ọdịnihu. Ị nọghị naanị gị, gị bụ nne ụmụaka! Jizọs nọnyeere gị mgbe niile! (Jọn 15:5) 

Okwu Chukwu

Ụbọchị 20Ụbọchị 22

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Children's Advent House

Ezigbo Nne, ọ na-adị gị ka oge Ekeresimesi ji ọsọ na ọgbaghara n'agabiga gị? Afọ a pụrụ ịdị iche. Ka gị na ụmụ gị chọpụta akụ nke ịhụnanya Kraịst n'Ekeresimesi a! Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka Ụmụaka bụ ọmarịcha agụmagụ ihe òfùfè dị ụbọchị iri abụọ na ise, zuru ezù, nwere akwụkwọ ihe omume ịga ebipụta nke ga-enyere aka tụzie obi ụmụ gị n'ebe Onye-nwe-anyị nọ ma mee ka oge Ekeresimesi a bụrụ ihe bara uru nye gị!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Help Club for Moms maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://helpclubformoms.com