Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka ỤmụakaIhe Atụ
Ụbọchị Nke Iri Abụọ Na Anọ: Gụọ 2 Pita 3:18
Chineke akpọghị anyị naanị ka anyị kweré na Jizọs dị adị́, kamakwa ka anyị too n'ime Ya! Akpọrọ anyị ka anyị soro Jizọs wee too n’ime Ya ụbọchị niile anyị na-adị ndụ n’ụwa a. Jizọs hụrụ gị n’anya nke ukwuu nke na ịga njem nke itolite n’ime Ya ga-abụ njem magburu onwe ya! Lee nzube n'ato ụtọ Chineke nyeworo gị!
Ihe Omume: N'ime mpempe akwụkwọ, see ite flawa nwere akụkụ anọ nke ọdụdụ n'acha ndụ ndụ si na okpuru ya n'apụta. Ihe ọzọ i ga-eme bụ, see ihe osise mkpịsị-aka nwa gị n'akuku abụọ nke ọdụdụ ahụ n'acha ndụ ndụ. Nke a bụ osisi vaịn ya na-eto eto! Gụọ Jọn 15:5 ma nyere nwa gị aka ka o chepụta ụzọ o ga-esi n'eto na mmekọrịta ya na Jizọs ma nọgide na njikọ n'adịghị ebi ebi. Dee echiche ndị ahụ n'akụkụ osise abụọ ndị ahụ nke mkpịsị-aka nwa gị. Ka nwa gị were agba chọọ osisi vaịn ya ahụ mma ma gị ana echetara ya otú o ga-esi n'eto na mmekọrịta ya na Jizọs!
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ezigbo Nne, ọ na-adị gị ka oge Ekeresimesi ji ọsọ na ọgbaghara n'agabiga gị? Afọ a pụrụ ịdị iche. Ka gị na ụmụ gị chọpụta akụ nke ịhụnanya Kraịst n'Ekeresimesi a! Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka Ụmụaka bụ ọmarịcha agụmagụ ihe òfùfè dị ụbọchị iri abụọ na ise, zuru ezù, nwere akwụkwọ ihe omume ịga ebipụta nke ga-enyere aka tụzie obi ụmụ gị n'ebe Onye-nwe-anyị nọ ma mee ka oge Ekeresimesi a bụrụ ihe bara uru nye gị!
More