Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka ỤmụakaIhe Atụ
Ụbọchị Nke Ise: Gụọ Luk 1:26-38
Mmụọ ozi wetaara Meri ozi dị ịtụnanya! Gịnị ka ọ bụ? Mechie anya gị ma were ya na mmụọ ozi bịakwutere gị ma wetara gị ụdị ozi e ziri Meri. Kedụ otu i si chee na ọ dị Meri mgbe ọ natara ụdị ozi ahu? Ị̀ hụrụ otú o si zaghachi “Abụ m ohu Onye-nwe-anyị”? Chineke na-akpọkwa gị òkù ka ị jeere Ya ozi ụbọchị taa! Ọ hụrụ gị n'anya nke ukwuu! Olee otú i nwere ike isi jeere Onye-nwe-anyị ozi dị ka Meri mere?
Ihe Omume: Wepụta ngwóngwó ụmụ gị nwere ike iji emepụta mmụọ ozi ma chọọ ya mma. Kwe ha ka ha jiri aka ha mee ụdị mmụọ ozi dị ha n'uche. Mee ka ihe omume a dị mfe site n'inye naanị akwụkwọ eji ese ihe na kreyọn ma ọ bụ tinyekwuo ihe ndị ọzọ dị ka abụbá ọkụkọ, ajirijí ihe n'egbuke egbuke, mpempe ákwà gasị n'eke muru muru, eriri n'ese esè, owú kọtin ekekoro ọnụ, ma ọ bụ iberibé akwụkwọ eji emepụta ihe ma ọ bụ ákwà nkití.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ezigbo Nne, ọ na-adị gị ka oge Ekeresimesi ji ọsọ na ọgbaghara n'agabiga gị? Afọ a pụrụ ịdị iche. Ka gị na ụmụ gị chọpụta akụ nke ịhụnanya Kraịst n'Ekeresimesi a! Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka Ụmụaka bụ ọmarịcha agụmagụ ihe òfùfè dị ụbọchị iri abụọ na ise, zuru ezù, nwere akwụkwọ ihe omume ịga ebipụta nke ga-enyere aka tụzie obi ụmụ gị n'ebe Onye-nwe-anyị nọ ma mee ka oge Ekeresimesi a bụrụ ihe bara uru nye gị!
More