Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka ỤmụakaIhe Atụ

Children's Advent House

ỤBỌCHỊ 10 NKE 25

Ụbọchị Nke Iri: Gụọ Luk 1:57-64

Nwa Elizabet na Zekaraya alolá ụwa! Gịnị ka ha gụrụ ya? Mgbe Jọn tolitere, o nwere ọrụ pụrụ iche nke ịgbasa ozi ọma ahụ dị ebube na Jizọs abịawo, bụ́ Chineke n’anụ ahụ́, Onye Nzọpụta nke ihe nile a kpọrọ mmadụ! Kedụ ka ị ga-esi gbasaa ozi ọma nke Onye Nzọpụta anyị Jizọs n'Ekeresimesi a?

Ihe Omume: Meeré otu onye kaadị Ekeresimesi ka ị gwa ha banyere Jizọs. Ị nwedịrị ike itinye amaokwu a na-esonụ n'ime kaadị gị iji kesaa ozi dị ịtụnanya banyere Jizọs. Jọn 3:16, “N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya otú ahụ, ka O jiri nye Ọkpara Ọ mụrụ naanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi kama ka onye ahụ nwee ndụ ebighị ebi.”

Okwu Chukwu

Ụbọchị 9Ụbọchị 11

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Children's Advent House

Ezigbo Nne, ọ na-adị gị ka oge Ekeresimesi ji ọsọ na ọgbaghara n'agabiga gị? Afọ a pụrụ ịdị iche. Ka gị na ụmụ gị chọpụta akụ nke ịhụnanya Kraịst n'Ekeresimesi a! Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka Ụmụaka bụ ọmarịcha agụmagụ ihe òfùfè dị ụbọchị iri abụọ na ise, zuru ezù, nwere akwụkwọ ihe omume ịga ebipụta nke ga-enyere aka tụzie obi ụmụ gị n'ebe Onye-nwe-anyị nọ ma mee ka oge Ekeresimesi a bụrụ ihe bara uru nye gị!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Help Club for Moms maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://helpclubformoms.com