Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka ỤmụakaIhe Atụ
Ụbọchị Nke Iri Na Otu: Gụọ Jọn 1:14
Amaokwu a ọ magbughị onwe ya! Akụkụ Akwụkwọ Nsọ a n'ekwu gbasara Jizọs na otu O siri bịa ụwa dịka nwa a mụrụ ọhụrụ iji zọpụta anyị na njọ anyị wee nye anyị ndụ ebighị ebi ma ọ bụrụ na anyị ahọrọ ịtụkwasị obi na Ya. Ị họrọlá ịtụkwasị obi na Ya?
Ihe Omume: Kpee ekpere maka ndị ị maara ma ọ bụ ndị nọ gburugburu ụwa n'adịghị eso Jizọs. Ọ bụ agụụ obi Chineke na mmadụ nile ga-abịaru Ya nso wee mara maka nzọpụta Ọ kwadebere anyị n'ime Kraịst!
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ezigbo Nne, ọ na-adị gị ka oge Ekeresimesi ji ọsọ na ọgbaghara n'agabiga gị? Afọ a pụrụ ịdị iche. Ka gị na ụmụ gị chọpụta akụ nke ịhụnanya Kraịst n'Ekeresimesi a! Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka Ụmụaka bụ ọmarịcha agụmagụ ihe òfùfè dị ụbọchị iri abụọ na ise, zuru ezù, nwere akwụkwọ ihe omume ịga ebipụta nke ga-enyere aka tụzie obi ụmụ gị n'ebe Onye-nwe-anyị nọ ma mee ka oge Ekeresimesi a bụrụ ihe bara uru nye gị!
More