Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka ỤmụakaIhe Atụ
Ụbọchị Nke Iri Na Ise: Gụọ Matiu 1:24-25 (Rịba Ámá: Akụkụ mbụ nke amaokwu iri abụọ na ise kwuru banyere oge Meri na Josef jiri mekọọ dịka di na nwunye. Ọ bụrụ na ị chọghị inye ma ọ bụ nata nkọwa banyere ihe ọ pụtara, i nwere ike ịgụ naanị njedebe nke amaokwu a). Josef rubere Onye-nwe-anyị isi site n’ime kpọmkwem dị ka mmụọ ozi ahụ nyere ya n’iwu! Ị n'enwe nsogbu irubere Onye-nwe-anyị isi?
Ihe aga eme-eme: Chineke nwere atụmatụ dị ịtụnanya maka ndụ gị! Kpee ekpere ma rịọ Onye-nwe-anyị ka O nyere gị aka irubere Ya isi! Gị na ndị mụrụ gị kparịta ụka banyere akụkụ ndụ gị ọ na-esiri ike irubere Chineke isi. Ị maara na ọbụna ndị nne na ndị nna aghaghị irubere Chineke isi, ma ha ghọtara nke ọma otú nrubeisi pụrụ isi sie ike! Nne gị na nna gị nwere ike inyere gị aka ma gbaa gị ume ka ị na-etolite iso Jizọs! Site n'enyemaka ha, depụta ma ọ bụ see ka osisè atụmatụ maka irubere Chineke isi na akụkụ ebe ị n'enwe nsogbu ime nke ahụ.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ezigbo Nne, ọ na-adị gị ka oge Ekeresimesi ji ọsọ na ọgbaghara n'agabiga gị? Afọ a pụrụ ịdị iche. Ka gị na ụmụ gị chọpụta akụ nke ịhụnanya Kraịst n'Ekeresimesi a! Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka Ụmụaka bụ ọmarịcha agụmagụ ihe òfùfè dị ụbọchị iri abụọ na ise, zuru ezù, nwere akwụkwọ ihe omume ịga ebipụta nke ga-enyere aka tụzie obi ụmụ gị n'ebe Onye-nwe-anyị nọ ma mee ka oge Ekeresimesi a bụrụ ihe bara uru nye gị!
More