Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka ỤmụakaIhe Atụ

Children's Advent House

ỤBỌCHỊ 12 NKE 25

Ụbọchị Nke Iri Na Abụọ: Gụọ Matiu 1:20-21

Gịnị ka mmụọ ozi ahụ gwara Josef ka ọ gụọ nwa ọhụrụ ahụ? Jizọs! Aha ahụ bụ́ Jizọs pụtara “Onye Nzọpụta.” Enyere ya Onye-nwe-anyị n’ihi na “Ọ na-azọpụta ndị Ya na mmehie ha” (Matiu 1:21). Aha magburu onwe ya, nke ga-akpali ịhụnanya n'ime obi gị na otuto n'egbugbere ọnụ gị!

Ihe Omume: Mee ihe ịchọ mma Jizọs maka osisi Ekeresimesi gị! Mee nke a ka ọ dị mfe ma ọ bụ nwé ọtụtụ ihe dịka ịchọrọ! Nke a bụ echiche ole na ole otù i ga-esi mee ya: Were otù bọlbụ n'enweghị ihe ịchọ mma na ya n'osisi Ekeresimesi gị, na ụfọdụ ihe eji ede ihe n'adịghị ehichapụ ehichapụ. Ka nwa gị dee aha Jizọs n’elu bọlbụ ahụ ma chọọ ya mma otu ọ masịrị ya. N'aka nke ọzọ, bepụta akwụkwọ dị okirikiri n'ime akwụkwọ eji ekechi ngwóngwó, tapanye osisi Popsicle ka ha dị n'ụdị "x" n'ahụ́ akwụkwọ okirikiri ahụ iji mee ụlọ-anụ maka nwa amụrụ ọhụrụ bụ Jizọs. N'akụkụ elu nke "x" ahụ, tapanye ụfọdụ ahihia kpọnwụrụ akpọnwụ i si n'èzí weta. Mepụta taata Jizọs site n'ibepụ ihe dịka 1" na njedebe nke osisi Popsicle nke atọ, see ihu n'akụkụ elu ya ma jiri Kleenex ma ọ bụ ntapanya ákwà mee ihe nkuchí n'ụzọ blanketị. Tapanye taata Jizọs n'ime ụlọ-anụ ahụ i mere ma tinye yarn ma ọ bụ eriri n'elu ya dịka ihe nkedó tupu gị dokwasí ya n'elu osisi Ekeresimesi gị.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 11Ụbọchị 13

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Children's Advent House

Ezigbo Nne, ọ na-adị gị ka oge Ekeresimesi ji ọsọ na ọgbaghara n'agabiga gị? Afọ a pụrụ ịdị iche. Ka gị na ụmụ gị chọpụta akụ nke ịhụnanya Kraịst n'Ekeresimesi a! Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka Ụmụaka bụ ọmarịcha agụmagụ ihe òfùfè dị ụbọchị iri abụọ na ise, zuru ezù, nwere akwụkwọ ihe omume ịga ebipụta nke ga-enyere aka tụzie obi ụmụ gị n'ebe Onye-nwe-anyị nọ ma mee ka oge Ekeresimesi a bụrụ ihe bara uru nye gị!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Help Club for Moms maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://helpclubformoms.com