Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka ỤmụakaIhe Nhụchatụ

Children's Advent House

ỤBỌCHỊ 13 NKE 25

Taa bụ ụbọchị ịgụ atụmatụ ihe òfùfè gị na ụmụ gị n'agụghị ma gbaa obi gị ume site n'okwu Chineke!

    Gụọ Akwụkwọ Nsọ nke taa ma kpee ekpere ka Mmụọ Nsọ kwuo okwu n'obi gị. Lee onyinye ana-apụghị ịkọwapụta nke anyị nwere na Jizọs, Onye Nzọpụta anyị!
  • Kpee ekpere wee nyefee Chineke ụbọchị gị. Rịọ Onye-nwe-anyị ka O nye gị amamihe, ọgụgụ-isi na ọmịiko. 
  • Kpee ekpere ka di gị na ụmụ gị nwee mmetụta udo nke Jizọs n'Ekeresimesi a. Kpee ekpere ka Jizọs nyere ndị niile nọ n'ụlọ gị aka ka ha n'adị ná mma ma hụ ibe ha n'anya nke ọma.

*Hụ na i lelerè ụbọchị iri abụọ na ise nke atụmatụ ihe ọgụgụ a maka njikọ ga-eduga na ozi otu ikpe ekpere maka amamihe, ọgụgụ-isi, na ọmịiko nwere ike isi nyere ụbọchị gị aka ịga nke ọma! 

Okwu Chukwu

Ụbọchị 12Ụbọchị 14

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Children's Advent House

Ezigbo Nne, ọ na-adị gị ka oge Ekeresimesi ji ọsọ na ọgbaghara n'agabiga gị? Afọ a pụrụ ịdị iche. Ka gị na ụmụ gị chọpụta akụ nke ịhụnanya Kraịst n'Ekeresimesi a! Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka Ụmụaka bụ ọmarịcha agụmagụ ihe òfùfè dị ụbọchị iri abụọ na ise, zuru ezù, nwere akwụkwọ ihe omume ịga ebipụta nke ga-enyere aka tụzie obi ụmụ gị n'ebe Onye-nwe-anyị nọ ma mee ka oge Ekeresimesi a bụrụ ihe bara uru nye gị!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Help Club for Moms maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://helpclubformoms.com