Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka ỤmụakaIhe Atụ
Ụbọchị Nke Itoolu: Gụọ Luk 1:46-49
N'amaokwu ndị a, Meri n'eto Chineke maka onyinye dị ịtụnanya O nyere a bụghị naanị ya kamakwa ụwa niile! O nwere ọtụtụ ihe mere ọ ga-eji tụọ egwù ihe afọ ime ọrụ-ebube a ga-apụtara ya, mana ọ họọrọ ịtụkwasị Chineke obi na ito Ya! Ị nwerè ike iche ọnọdụ ọ bụla i nwere ike ịtụkwasị Chineke obi n'ụzọ miri emi? Kedụ ka ị ga-esi họrọ ibi ndụ nke otuto n'ihu Chineke?
Ihe Omume: Tapanye mpempe akwụkwọ na friji gị ma ọ bụ na mgbidi ime ụlọ gị wee depụta n'uju ihe niile ị nwere ike ito Chineke maka ha n'ụbọchị gị! Iwulite obi otuto site na nwata bụ ihe mara mma!
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ezigbo Nne, ọ na-adị gị ka oge Ekeresimesi ji ọsọ na ọgbaghara n'agabiga gị? Afọ a pụrụ ịdị iche. Ka gị na ụmụ gị chọpụta akụ nke ịhụnanya Kraịst n'Ekeresimesi a! Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka Ụmụaka bụ ọmarịcha agụmagụ ihe òfùfè dị ụbọchị iri abụọ na ise, zuru ezù, nwere akwụkwọ ihe omume ịga ebipụta nke ga-enyere aka tụzie obi ụmụ gị n'ebe Onye-nwe-anyị nọ ma mee ka oge Ekeresimesi a bụrụ ihe bara uru nye gị!
More