Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka ỤmụakaIhe Atụ
Ụbọchị Nke Asatọ: Gụọ Luk 1:39-45
Tupu a mụọ Jọn, o pụrụ imata Onye-Nzọpụta ya, bụ́ Jizọs! Ụmụ amụrụ ọhụrụ dị ịtụnanya ma dị oké ọnụ ahịa n'anya Chineke site n'ụbọchị ha malitere itolite n'afọ nne ha!
Ihe Omume: Gị na nwa gị lelee onyonyo ultrasound ma ọ bụ foto ya gasị mgbe a mụrụ ya ọhụrụ. Kparịtanụ otu Chineke si mee nwa ọhụrụ ọbụla ka ọ pụọ iche na dị uru. Rutu-aka n’Abụ Ọma 139:13-18 maka akụkụ Akwụkwọ Nsọ mara mma banyere otù Chineke si akpụ nwa ọ bụla n’afọ nne ya. Gwa ụmụ gị mkpa ọdị iji ụmụaka kpọrọ ihe dịka ihe okike pụrụ iche nke Chineke!
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ezigbo Nne, ọ na-adị gị ka oge Ekeresimesi ji ọsọ na ọgbaghara n'agabiga gị? Afọ a pụrụ ịdị iche. Ka gị na ụmụ gị chọpụta akụ nke ịhụnanya Kraịst n'Ekeresimesi a! Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka Ụmụaka bụ ọmarịcha agụmagụ ihe òfùfè dị ụbọchị iri abụọ na ise, zuru ezù, nwere akwụkwọ ihe omume ịga ebipụta nke ga-enyere aka tụzie obi ụmụ gị n'ebe Onye-nwe-anyị nọ ma mee ka oge Ekeresimesi a bụrụ ihe bara uru nye gị!
More