Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka ỤmụakaIhe Atụ
Taa bụ ụbọchị ịgụ agụmagụ ihe òfùfè ọbụla i n'enweghị ohere ka gị na ụmụ gị gụọ na ịgba obi gị ume site n'Okwu Chineke!
-
Gụọ Akwụkwọ Nsọ taa ma kpee ekpere ka Mmụọ Nsọ kwuo okwu n'obi gị. Ị̀ nwèrè ike ichetụ n'echiche otú o si dị ịtụnanya ihu ìgwè ndị mmụọ ozi nke eluigwe ka ha n'ezi ozi ọmụmụ nke Onye-Nzọpụta anyị?!
- Kpee ekpere wee nyefee Chineke ụbọchị gị. Rịọ Onye-nwe-anyị maka amamihe, ọgụgụ-isi, na ọmịiko.
- Kpee ekpere ka di gị na ụmụ gị nwee mmụọ amamihe na mkpughe ka ha wee mara Chineke nke ọma (Ndị Efesọs 1:17).
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ezigbo Nne, ọ na-adị gị ka oge Ekeresimesi ji ọsọ na ọgbaghara n'agabiga gị? Afọ a pụrụ ịdị iche. Ka gị na ụmụ gị chọpụta akụ nke ịhụnanya Kraịst n'Ekeresimesi a! Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka Ụmụaka bụ ọmarịcha agụmagụ ihe òfùfè dị ụbọchị iri abụọ na ise, zuru ezù, nwere akwụkwọ ihe omume ịga ebipụta nke ga-enyere aka tụzie obi ụmụ gị n'ebe Onye-nwe-anyị nọ ma mee ka oge Ekeresimesi a bụrụ ihe bara uru nye gị!
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Help Club for Moms maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://helpclubformoms.com