Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka ỤmụakaIhe Atụ
Ụbọchị Nke Atọ: Gụọ Luk 1:11-20
Zekaraya na nwunye ya emeela ezigbo agadi mgbe Chineke zitere mmụọ ozi ka ọ gwa ya na nwunye ya ga-amụ nwa—nwa ọhụrụ pụrụ nnọọ iche nke ga-akwadebere Jizọs ụzọ! N'ebe Chineke nọ, ihe nile kwere omume! Otu o sila dị, Zekaraya ekwetaghị na Chineke nwere ike ime ụdị ọrụ ebube ahụ na ndụ ya. Gịnị mere Zekaraya n’ihi ekweghị ekwe ya?
Ihe Omume: Dee ọtụtụ mkpụrụokwu n'ime mpempe akwụkwọ gasị (anụmanụ, egwuregwu, ma ọ bụ akụkọ ụmụ gị hụrụ n'anya ga-adị mma maka nke a). Gwa nwa gị ka ọ họrọ otu mpempe akwụkwọ ma mee ihe e dere na ya ka ndị ọzọ kọwapụta ihe ọ bụ. Ọ̀ na-esirí gị ike mmadụ ịma ihe i n'eme mgbe ị na-apughị ikwu okwu? Olee otú i chere o si dị Zekaraya mgbe mmụọ ozi kuchirì ya ọnụ?
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ezigbo Nne, ọ na-adị gị ka oge Ekeresimesi ji ọsọ na ọgbaghara n'agabiga gị? Afọ a pụrụ ịdị iche. Ka gị na ụmụ gị chọpụta akụ nke ịhụnanya Kraịst n'Ekeresimesi a! Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka Ụmụaka bụ ọmarịcha agụmagụ ihe òfùfè dị ụbọchị iri abụọ na ise, zuru ezù, nwere akwụkwọ ihe omume ịga ebipụta nke ga-enyere aka tụzie obi ụmụ gị n'ebe Onye-nwe-anyị nọ ma mee ka oge Ekeresimesi a bụrụ ihe bara uru nye gị!
More