Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka ỤmụakaIhe Atụ
Ụbọchị Nke Abụọ: Gụọ Malakaị 4:5
Ka anyị laghachi azụ n’oge, ọtụtụ narị afọ tupu a mụọ Jizọs. Chineke nyere ndị amụma, dị ka Ịlaịja, ịkwadebe obi ndị mmadụ maka ọbịbịa Jizọs! Ọ chọrọ ka ndị mmadụ nweta ohere niile kwesiri ekwesi ikwere na Mezaịa ahụ na-abịanụ, Onye Nzọpụta nke ga-asachapụ mmehie nke ndị nile họọrọ Ya. Ọbụna ugbu a, Ọ n'eji ịhụnanya jide ụmụ Ya, na-asachapụ mmehie anyị, n'enye anyị ohere inwe mmekọrịta, ọbụbụenyi anyị na Ya nke dị nso karịa ihe ọ bụla ọzọ anyị nwere ike iche n'echiche. Ma ịma nke kachasị adị ụtọ? Ọ ga-abịa ọzọ n’oge na-adịghị anya ime ka ihe niile dị mma ma kpọrọ anyị laa n’eluigwe. Ị dị njikere maka nke a?
Ihe Omume: Mee ígwè-okwu jirí akwụkwọ eji eme nhicha ma ọ bụ mkpokoro akwụkwọ siri ike. Ọbịbịa mbụ Jizọs, atụmatụ Ya ịzọpụta anyị na inye anyị ohere isi na mmehie anyị pụọ bụ ihe mere anyị ji agba Ekeresimesi! Ime ememe Ekeresimesi dị ezigbo ụtọ! Ọ ga-abịa ọzọ n'oge n'adịghị anya! Jiri ígwè-okwu ị mere zie ndị niile ga-ege gị ntị ozi ọma Jizọs! Ṅụrịa ọṅụ ụbọchị taa!
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ezigbo Nne, ọ na-adị gị ka oge Ekeresimesi ji ọsọ na ọgbaghara n'agabiga gị? Afọ a pụrụ ịdị iche. Ka gị na ụmụ gị chọpụta akụ nke ịhụnanya Kraịst n'Ekeresimesi a! Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka Ụmụaka bụ ọmarịcha agụmagụ ihe òfùfè dị ụbọchị iri abụọ na ise, zuru ezù, nwere akwụkwọ ihe omume ịga ebipụta nke ga-enyere aka tụzie obi ụmụ gị n'ebe Onye-nwe-anyị nọ ma mee ka oge Ekeresimesi a bụrụ ihe bara uru nye gị!
More