Ibu Ọnụ Ụbọchị Iri Abụọ Na OtuIhe Nhụchatụ

Agbanyeghị otú i si dị omimi n'ije gị ugbu a n'ime Chineke, gakwuo ihu n'ije a dị omimi. Echegbula onwe gị maka ihe ga-erukpu ma ọ bụ metụ mmiri. Akwụsịla n'ebe ị nwere ike ịkwụgidesi ike n'ụkwụ gị. Kwe ka mmiri ije a buru gị gawa. Ọ bụ gịnị ka ị jigidesiri ike? Kedụ ihe na-egbochi gị ibi ndụ okwukwe nke mmụọ Chineke na-edu? Kedụ ihe ọ ka dị gị na ọ bụ gị n'achịkwa ya? Nyefee onwe gị dum n'ije omimi a. Kpee ekpere taa ka ibu ọnụ a bụrụ nnọọ mmalite nke mmekọrịta miri emi nke gị na Chineke. Kpee ekpere ka Ọ gaa n'ihu na-akpọ gị òkù ịbakwu n'ime ma kwe Ya ka Ọ bụrụ aka ji ndụ gị n'ezie.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Malite afọ ọhụrụ gị n'ilekwasị anya na ọzụzụ ime mmụọ nke ibu ọnụ. Atụmatụ ihe ọgụgụ a gụnyere ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ gbasara ibu ọnụ na ndị ọzọ na-agba ume ime ntụgharị uche na ịbịaru Chineke nso. Site n'otu ụbọchị ruo nke iri abụọ na otu, ị ga n'enweta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ị ga n'agụ kwa ụbọchị, obere ihe ọgụgụ nke òfùfè, ajụjụ gasị na-akpali ntụgharị uche, na ekpere ga-echebe gị ihu n'ihe bara uru. Maka ọdịnaya ndị ọzọ, lelee www.finds.life.church.
More
We'd like to thank Life.Church for their generosity in providing the structure for the 21 Day Fast reading plan.