Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ibu Ọnụ Ụbọchị Iri Abụọ Na OtuIhe Atụ

21 Day Fast

ỤBỌCHỊ 19 NKE 21

Ike ọ na-agwụ gị n'obi gị ma n'anụ ahụ gị? Ka ị na-erute njedebe nke ịbụ ọnụ gị, chee maka ọṅụ magburu onwe ya nke iji otu ụbọchị a fee Chineke ofufe n'ime obi-eze Ya. Too Ya maka ụzọ dịgasịnụ i na-etowanye ma jiri n'achọkwu ihu Ya. N'agbanyeghị ebe ọbụla i nọ, jiri olu dara ụda gụọ Abụ Ọma a dịka ekpere gị nye Chineke. Gbanwee ya otú ị sị chọọ ma ọ bụ tinye ihe ọbụla ị chọrọ n'ime ya. Jiri olu ike guputa ya ma ọ bụ jiri olu nwaayọ kpee ya.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 18Ụbọchị 20

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

21 Day Fast

Malite afọ ọhụrụ gị n'ilekwasị anya na ọzụzụ ime mmụọ nke ibu ọnụ. Atụmatụ ihe ọgụgụ a gụnyere ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ gbasara ibu ọnụ na ndị ọzọ na-agba ume ime ntụgharị uche na ịbịaru Chineke nso. Site n'otu ụbọchị ruo nke iri abụọ na otu, ị ga n'enweta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ị ga n'agụ kwa ụbọchị, obere ihe ọgụgụ nke òfùfè, ajụjụ gasị na-akpali ntụgharị uche, na ekpere ga-echebe gị ihu n'ihe bara uru. Maka ọdịnaya ndị ọzọ, lelee www.finds.life.church.

More

We'd like to thank Life.Church for their generosity in providing the structure for the 21 Day Fast reading plan.