Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ibu Ọnụ Ụbọchị Iri Abụọ Na OtuIhe Atụ

21 Day Fast

ỤBỌCHỊ 17 NKE 21

Nke a bụ otu n'ime akụkọ ndị chakere ka anwụ n'ime Akwụkwọ Nsọ.
Ị gaghị asị na ị nwebeghị ụdị ahụmahụ umu okorobịa ato ndị a gabigara, mgbe ihe ahuru n'anya fepuru n'ihu eziokwu.
Ihe ahuru n'anya bụ na ha dara iwu, nke ntarama ahụhụ ya bụ ọnwụ, Nebukadineza bụ nwoke nwere ikikere niile n'uwa niile, ọkụ nke olulu-ọkụ ya pụrụ igbu onye nche nọ yabụ olulu-ọkụ nso, e wee nwe otutu ndị nche dị njikere iluba ụmụ okorobịa atọ ndị a dara iwu ya n'ime olulu-ọkụ ahụ, ihe diiri ụmụ okorobịa atọ a bụ na ọ bụrụ na ha egbughị ikpere n'ala nye arụsị Nebukadineza, ha ga-agba ọkụ repia n'ime olulu-ọkụ ahu a kwadooro ha.
Okwu agwụla.
Mana eziokwu megiderè ihe ndị ahu ahuru n'anya, eziokwu a bụkwanụ ihe umu okorobia ato a kwugidere n'elu ya.
Eziokwu ha bụ na o bụrụgodị na Chi ha azọpụtaghị ha, ha ga-ewere obi ha niile nwụọ n'ofufe Ya.
Eziokwu nke dị irè bụ na Okpara Chineke so ha gaa ije n'ime olulu-ọkụ ahụ.
Kedụ ihe ahuru anya ịna agabiga n'eguzogide eziokwu Chineke?
Were ihe ndị ahu ahuru n'anya gaa n'ihu Chineke n'ekpere, ụbọchị taa, ma jiri obi siri ike kwere na Chineke gị ga-abịa nọnyere gị n'ime olulu-ọkụ ahu i n'eche ihu.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 16Ụbọchị 18

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

21 Day Fast

Malite afọ ọhụrụ gị n'ilekwasị anya na ọzụzụ ime mmụọ nke ibu ọnụ. Atụmatụ ihe ọgụgụ a gụnyere ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ gbasara ibu ọnụ na ndị ọzọ na-agba ume ime ntụgharị uche na ịbịaru Chineke nso. Site n'otu ụbọchị ruo nke iri abụọ na otu, ị ga n'enweta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ị ga n'agụ kwa ụbọchị, obere ihe ọgụgụ nke òfùfè, ajụjụ gasị na-akpali ntụgharị uche, na ekpere ga-echebe gị ihu n'ihe bara uru. Maka ọdịnaya ndị ọzọ, lelee www.finds.life.church.

More

We'd like to thank Life.Church for their generosity in providing the structure for the 21 Day Fast reading plan.