Ibu Ọnụ Ụbọchị Iri Abụọ Na OtuIhe Atụ
Ị na-atụle ịga n'ihu n'ibu ọnụ gị ma ọ bụ ikekwe ịmalite omume ọhụrụ nke ibu ọnụ mgbe niile? N'isiakwụkwọ a, ndị mmadụ nọ n'atụle ma ha ga-aga n'ihu n'eso kalenda obubu ọnụ nke ha debere, ma Onye-nwe-anyị zara site n'aka Zekaraya. Kemgbe oge Mozis, Chineke hiwere kalenda dum nke obubu ọnụ na oriri. E mere ha abụọ ka ha dọrọ ndị Ya ịbịaru Ya nso. Ọ bụrụ na ịbịaru Chineke nso bụ ihe mgbaru ọsọ gị kwa ụbọchị, oge gasị nke ibu ọnụ na oriri pụrụ ịdị nsọ nye Onye-nwe-anyị. Wepụta oge ka Chineke gwa gị okwu gbasara ahụmịhe si na ibu ọnụ gị. Rịọ Chineke ka Ọ nyere gị aka ịtụgharị uche n'otú ibu ọnụ gị siri mee ka obi gị dị nrò ma mee ka ị n'emeso ndị ọzọ ihe n'ụzọ ka mma.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Malite afọ ọhụrụ gị n'ilekwasị anya na ọzụzụ ime mmụọ nke ibu ọnụ. Atụmatụ ihe ọgụgụ a gụnyere ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ gbasara ibu ọnụ na ndị ọzọ na-agba ume ime ntụgharị uche na ịbịaru Chineke nso. Site n'otu ụbọchị ruo nke iri abụọ na otu, ị ga n'enweta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ị ga n'agụ kwa ụbọchị, obere ihe ọgụgụ nke òfùfè, ajụjụ gasị na-akpali ntụgharị uche, na ekpere ga-echebe gị ihu n'ihe bara uru. Maka ọdịnaya ndị ọzọ, lelee www.finds.life.church.
More
We'd like to thank Life.Church for their generosity in providing the structure for the 21 Day Fast reading plan.