Ibu Ọnụ Ụbọchị Iri Abụọ Na OtuIhe Atụ
![21 Day Fast](/_next/image?url=https%3A%2F%2Fimageproxy.youversionapi.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans%2F35%2F1280x720.jpg&w=3840&q=75)
Ị na-ebido ibu ọnụ nke izu atọ n'izu ikpeazụ nke ibu ọnụ gị. Ọ bụrụ na o nwere otù gị na ha so ebu ọnụ a, wepụtanụ oge meenụ ntụgharị-uche ma ṅụrịanụ maka ihe Chineke bidoro ime n'ime unu. O bụrụ na naanị gị so ebu ọnụ a, hụ na ị nọ n'edetụ ahụmahụ gị niile kemgbe i bidoro ibu ọnụ. O nwere ike dị gị ka ị nọ n'ofe n'izu ikpeazụ a, mana nye ndị ọzọ, izu ikpeazụ a na-esiri ha ike karịa. Rịọ Chineke ka O nyochaa gị ma bido gbawa ọkụ Ya n'akụkụ niile nke obi gị dị ọchịchịrị. Rịọ Ya ka O jiri izu ikpeazụ a yọchaa gị ma saa gị ezigbo osisá.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
![21 Day Fast](/_next/image?url=https%3A%2F%2Fimageproxy.youversionapi.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans%2F35%2F1280x720.jpg&w=3840&q=75)
Malite afọ ọhụrụ gị n'ilekwasị anya na ọzụzụ ime mmụọ nke ibu ọnụ. Atụmatụ ihe ọgụgụ a gụnyere ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ gbasara ibu ọnụ na ndị ọzọ na-agba ume ime ntụgharị uche na ịbịaru Chineke nso. Site n'otu ụbọchị ruo nke iri abụọ na otu, ị ga n'enweta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ị ga n'agụ kwa ụbọchị, obere ihe ọgụgụ nke òfùfè, ajụjụ gasị na-akpali ntụgharị uche, na ekpere ga-echebe gị ihu n'ihe bara uru. Maka ọdịnaya ndị ọzọ, lelee www.finds.life.church.
More
We'd like to thank Life.Church for their generosity in providing the structure for the 21 Day Fast reading plan.