Ibu Ọnụ Ụbọchị Iri Abụọ Na OtuIhe Atụ
Ngọzi na-adịrị ndị agụụ n'agụ nye... Ọ bụrụ na ọ dị gị otu ahụ, wepụta oge tụgharịa uche na akụkụ a na-akpọ Okwu Ngọzi ma ọ bụ Ngọzi-Gasị. Were obi gị, ụbọchị taa, guzuo ngọzi niile Onye-nwe-anyị nyewooro gị. Debe nwa akwụkwọ na akụkụ gị ụbọchị a niile iji detuo ngọzi niile Chineke ga-ewetara gị n'uche gị. Kpee ekpere iji kelee Ya maka ngọzi ndị ahụ niile, ọbụladị ndị bịaranu site n'igabiga ntaramahụhụ na ọnwụnwa dị iche iche.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Malite afọ ọhụrụ gị n'ilekwasị anya na ọzụzụ ime mmụọ nke ibu ọnụ. Atụmatụ ihe ọgụgụ a gụnyere ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ gbasara ibu ọnụ na ndị ọzọ na-agba ume ime ntụgharị uche na ịbịaru Chineke nso. Site n'otu ụbọchị ruo nke iri abụọ na otu, ị ga n'enweta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ị ga n'agụ kwa ụbọchị, obere ihe ọgụgụ nke òfùfè, ajụjụ gasị na-akpali ntụgharị uche, na ekpere ga-echebe gị ihu n'ihe bara uru. Maka ọdịnaya ndị ọzọ, lelee www.finds.life.church.
More
We'd like to thank Life.Church for their generosity in providing the structure for the 21 Day Fast reading plan.