Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 51

51
Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid: mb͕e Netan, bú onye-amuma, biakutere ya, mb͕e ọ bakusiri Bat-sheba.
1Merem amara, Chineke, dika ebere-Gi si di:
Dika iba-uba nke obi-ebere-Gi nile si di hichapu njehiem nile.
2Sucham nke-ọma dika ákwà ka ajọ omumem pua nimem,
Me kwa ka m'si na nmehiem di ọcha.
3N'ihi na mu onwem mara njehiem nile:
Nmehiem di kwa n'irum mb͕e nile.
4Megide Gi, nání Gi, ka m'mehieworo,
Ọ bu kwa ihe jọrọ njọ n'anya-Gi ka m'meworo:
Ka I we buru onye ezi omume mb͕e I nēkwu okwu,
Di kwa ọcha n'obi mb͕e I nēkpe ikpe.
5Le, n'ajọ omume ka amuputaram;
Ọ bu kwa na nmehie ka nnem turu imem.
6Le, ezi-okwu n'akuku nile di nime madu atọwo Gi utọ:
Ọ bu kwa n'akuku zoro ezo ka i nēme ka m'mara amam-ihe.
7I gēwere hyssop wepu nmehiem, m'gādi kwa ọcha:
I gāsucham dika ákwà, m'gādi kwa ọcha kari snow.
8I gēme ka m'nuru olu obi-utọ na ọṅù;
Ka ọkpukpu nile I gwepiaworo we tegharia egwú-ọṅù.
9Zopu iru-Gi na nmehiem nile,
Hichapu kwa ajọ omumem nile.
10Kèrem obi di ọcha, Chineke;
Me kwa ka mọ nke nēguzosi ike di ọhu nimem.
11Atupulam n'iru Gi;
Anara-kwa-lam Mọ Nsọ Gi.
12Nyeghachim obi-utọ nke nzọputa-Gi:
Were kwa mọ nke amara aha-ya kwagidem.
13M'gēzí ndi-njehie uzọ-Gi nile;
Ndi-nmehie gālaghachikute kwa Gi.
14Naputam n'aka ikpe-ọmuma ọbara di iche iche, Chineke, bú Chineke nke nzọputam;
Irem gēti nkpu ọṅù bayere ezi omume-Gi.
15Onye-nwe-ayi, I gēmeghe eb͕ub͕ere-ọnum abua;
Ọnum gēgosi kwa otuto-Gi.
16N'ihi na àjà adighi-atọ Gi utọ; ka m'we nye ya:
Àjà-nsure-ọku adighi-atọ Gi utọ.
17Àjà nile nke Chineke bu mọ tiwara etiwa:
Obi tiwara etiwa na nke egwepiara egwepia, Chineke, I dighi-eleda ya anya.
18Mere Zaion nma dika o si di Gi utọ:
I gālu mb͕idi nile nke Jerusalem.
19Mb͕e ahu ka àjà nile nke ezi omume, bú àjà-nsure-ọku na àjà-nsuresi-ọku, gātọ Gi utọ:
Mb͕e ahu ka ha gāchu ọtutu oke-ehi n'elu ebe-ichu-àjà-Gi.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ ỌMA 51: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye