Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ekeresimesi Maka Ụmụaka: Ụbọchị Iri Abụọ Nke UdoIhe Atụ

Christmas for Kids: 12 Days of Peace

ỤBỌCHỊ 12 NKE 12

Ya Onwe Ya Bụ Udo Anyị

Nke Sitere Na Sabrina

< p>AKỤKỌ
Otu ọnwa tupu Ekeresimesi eruo, nne m kpọkọtara mụ na ụmụnna m ka anyị mee atụmatụ nke anyị banyere Abalị ga-abọ Ekeresimesi. Ọ na-adị ndị mụrụ m ezigbo mmasị ikpokọta ndị enyi ka ha ju n'ụlọ anyị, ya mere ụlọ m na-eju eju mgbe niile. Kwa afọ, ndị mụrụ m na-ekwe ka anyị kpọọ otu ezinụlọ ka anyị na ha rikọọ́ nri n'abalị ga-abọ Ekeresimesi. Echetara m otu afọ ụmụnna m chọrọ ịkpọta otu ezinụlọ nwere nwa nwanyị na-abụghị enyi m ma ọlị. Ọ ka m n'ihe egwuregwu ọbụla, ka m nwee akara ugo dị mma n'ihe mmụta, ka m nwee ọtụtụ ndị enyi, ọ naghị akpọ m òkù ịbịa rie oriri n'ememe nke ụbọchị a mụrụ ya. . . n'ezie ọ bụghị enyi m ma ọlị. Hoo haa. Mana aghaghị m ịnakwere ka mụ na ya nọkọọ awa ole na ole n'abalị ahụ ga-abọ Ekeresimesi. Ka ọ dị, ọ bụ Ekeresimesi ma onye ọ bụla n'enwe aṅụrị na ya. Mana ka m gwa gị? Ọ bụ otu n'ime abalị ga-abọ Ekeresimesi kacha mma ma enwetara m enyi ka enyi ọhụrụ!

AKWỤKWỌ NSỌ
Gụọ Ndị Efesọs 2.

TỤLEE NKE A
Na Ndị Efesọs 2, Pọl kwuru na site n’aka Jizọs, anyị pụrụ ịbụ enyi Chineke, a bụghị ndị iro. Gịnị kpatara nke a? Mmehie, nke anyị nile na-eme, n'eme ka anyị bụrụ ndị iro nke Chineke. N’ihi mmejọ anyị, anyị apụghị ịbịa n’ihu Chineke zuru okè. N’ihi mmehie anyị, anyị kwesịrị inara ikpe ziri ezi nke Chineke; anyị bụ ndị ikpe mara. Mana Chineke hụrụ anyị n'anya nke ukwuu, Ọ na-aṅụrị ọṅụ inye mgbaghara.

Chineke hụrụ anyị n’anya wee zite Ọkpara Ya Jizọs ka Ọ nwụọ n’obe maka ndị ewezugara n’alaeze: gị, mụ, enyi gị, onye iro m, anyị niile. Ọ bụ ezie na anyị kewapụrụ n’ebe Chineke nọ n’ihi mmehie anyị, Jizọs na-akpọghachite anyị ọzọ, ma ugbu a, anyị nwere ike ibi n’udo n’ebe Chineke nọ, anyị na ndị ọzọ, na anyị onwe anyị! Onye ọ bụla nke kpebiri iso Jizọs bụ enyi Chineke na nwa Chineke ma nwee ike nweta ike na udo nke Chineke na ndụ ha. N'ime Jizọs Kraịst, e nweghị ndị iro.

MEE NKE A
Taa, chee echiche banyere ndụ gị. Ị̀ ka ndị ọzọ mma? Ị bụ enyi ma ọ bụ onye iro nke Chineke? Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ enyi Chineke ruo mgbe ebighị ebi ma nweta ike nke Chineke na ndụ gị, rịọ ndị mụrụ gị ka gị na ha kpekọọ ekpere ka i kpọbata Jizọs n'ime obi gị.

KPEE EKPERE
Ezi Chineke m, daalụ nke ukwuu maka ịkpọghachite anyị n’ebe Ị nọ. Daalụ maka ịnwụ n'obe maka mmehie m ka m wee bụrụ enyi Gị ruo mgbe ebighị ebi. Amen.

Ọ bụ olileanya anyị na iso anyị nwee ezigbo aṅụrị n'ime njem nke ụbọchị iri na abụọ a. Ọṅụ Ekeresimesi diri gị!

Okwu Chukwu

Ụbọchị 11

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Christmas for Kids: 12 Days of Peace

N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ nke ụbọchị iri na abụọ a maka ụmụaka, ị ga-agụ ihe niile gbasara onyinye udo nke na-abịa site n'aka Jizọs na otu anyị ga-esi nweta udo ahụ n'ime obi anyị kwa ụbọchị!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Calvary Chapel Ft. Lauderdale maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://CalvaryFTL.org/Bible-Plans