Ekeresimesi Maka Ụmụaka: Ụbọchị Iri Abụọ Nke UdoIhe Atụ
Udo: Ngwọta Nke Ụjọ
Nke Nick K.
AKỤKỌ
Otu oge, mụ na ezinụlọ m nọ n'ekiri ụfọdụ ọdụm na zuu. Otu n’ime ụmụaka so anyị bịa nọ na-agba ọsọ site na mbido ruo na njedebe nke ogige ebe ejigedere ọdụm ndị ahụ, bụ́ otu n’ime ogige ndị ahụ toro ezigbo ogologo isi elu ha rịgọrọ̀ n'ime iji wee kwụsị ọdụm ndị ahụ ka ha ghara iwupụta.
Ka nwata ahụ nọ na-agba ọsọ, otu ọdụm n'ime ha malitere iso ya n'eme ka o si eme. Na mbụ, ọ bụ ihe ọchị ịhụ nnukwu ọdụm a na-eso obere nwa a n'ejeghari, mana ka nwata ahụ nọgidere na-agba ọsọ, obere egwù bidoro tụwa m. Nke ahụ bụ n'ihi na ọdụm bụ nnukwu anụ na nke na-adọgbu ihe ọbụla ruru ya nso. Anya ọdụm ahụ gosiri m otú ịgụ banyere ihe dị́ ike na inwe ya n'ihu gị si dị iche, na otú ọ pụrụ isi gbanwee otú i si ele ụwa.
OKWU CHINEKE
Gụọ Luk 1:28–30.
TỤLEE NKE A
Gịnị mere ezigbo egwù jiri jide Meri? Ndị mmụọ ozi na ọdụm dị iké, mana otu ha abụọ si eme ka anyị tụọ ụjọ dị iche. Akwụkwọ Nsọ jupụtara n'akụkọ banyere ndị mmadụ zutere ndị mmụọ ozi na ịhụ ụdị mmụọ dị iche iche. Ọtụtụ mgbe, ha na-achọ ife ha òfùfè ma ọ bụ daa n’ala n’ihi ụjọ.
Ọbụna n'ọnọdụ ebe Chineke n'Onwe Ya pụtara (jiri ígwé-ojii ma ọ bụ ọkụ n'ere ere kpuchie Onwe Ya), ọ́ pụrụ ịdị na iyí egwù n'ezie. Mgbe Chineke napụtara ndị Izrel n’Ijipt, O gosiri ha Onwe Ya n’ụzọ dị otú ahụ. Ụmụ Izrel tụrụ egwù nke ukwuu nke na ha rịọrọ Mozis ka ọ nochie anya ha n'ikwuru Chineke okwu.
Ozi ọma nye anyị bụ na dị ka mmụọ ozi ahụ gwara Meri, anyị nwere ihu ọma Chineke, ịhụnanya Ya, na mmetụta obi ọma Ya. N’ihi Jizọs, anyị nwere ike iguzo n’ihu Chineke wee hụ Ya otú Ọ dị! Anyị pụrụ inwe udo n'ihu Ya.
MEE NKE A
Chineke nọ gị nso ọbụlagodi mgbe ọ dị gị ka ị nọ naanị gị. Wepụta oge ugbu a nọdụ ala wee kpee ekpere n'ime obi gị.
KPEE EKPERE
Ezi Chineke m, daalụ maka udo nke Ị n'ewetara anyị site n’aka Jizọs. Mụ na Gị pụrụ ịnọkọ egwù agaghị ejide m n'ihi na m bụ nke Ya. Nyere m aka icheta mgbe niile na Ị nọ m nso. Amen.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ nke ụbọchị iri na abụọ a maka ụmụaka, ị ga-agụ ihe niile gbasara onyinye udo nke na-abịa site n'aka Jizọs na otu anyị ga-esi nweta udo ahụ n'ime obi anyị kwa ụbọchị!
More