Ekeresimesi Maka Ụmụaka: Ụbọchị Iri Abụọ Nke UdoIhe Atụ
Ebube Nke Eluigwe, Udo N'Ụwa
Sitere Na Janice< /strong>
AKỤKỌ
Mgbe mmadụ gwara m na ha nwere ihe mara mma ha ga-enye m, ọ na-adị m ka ha weta ya ozugbo ozugbo! Apụghị m ịnọ jụụ tupu ha agwa m ozi ọma maka yabụ ihe! Ọ bụrụ na ha agwa m na ha ga-agwa m ozi ọma ahụ n’ụtụtụ, dị ka ụbọchị ga-abọ nke Ekeresimesi, ụra ga-esi m n'anya gbapụ n'ihi OKÉ obi ụtọ m nwere! Ụfọdụ n'ime ozi KACHASỊ dị ịtụnanya m nwetaberè bụ, "Tinye ụfọdụ uwe n'akpa, anyị n'aga nje m mara nma! Anyị na-aga n'ugwu ebe snọ na-ada! Anyị na-aga igwuriegwú na snọ!" Otu oge e mere m nnukwu obi ụtọ site n'ikpó m gaa n'ebe mara nma a na-akpọ Disney World! Ihe ịtụnanya N'AMASỊ m nke ukwuu m wee HỤKWA inata ozi ọma N'ANYA nke ukwuu!
AMAOKWU
Gụọ Luk 2:8–15.
Tụlee Nke A
Were ya na ị kpọ̀ nkịta gị ka o jee nwa ije n'ime ama ebe a n'ezu ike n'uhuruchi dị jụụ mkpọtụ adịghị eme, mana tupu gị mechie anya gị meghee ya ọtụtụ ndị mmụọ ozi esi n'eluigwe pụta jú n'ihu gị wee malite ịbụ abụ na ito Chineke! Ihe nke a ọ dịghị oké ịtụnanya! Ozi ọma ahụ ndị mmụọ ozi ziri ndị ọzụzụ atụrụ ahụ, bụkwa maka anyị! Chineke na-akpọ anyị òkù ịbịa zute Ọkpara Ya bụ́ Jizọs. Mmụọ ozi ahụ gwara ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na Jizọs bụ Onye Nzọpụta maka mmadụ niile. Ọkpụkpọ òkù ahụ bụ̀ ịbịakwute Jizọs n'ihi na ọ bụ site na Jizọs ka anyị pụrụ ịmata Chineke! Chineke zitere Jizọs n'ime ụwa ka O wee burú mmehie anyị n'Onwe Ya ma taa ahụhụ nke kwesịrị anyị. Nke a bụ ozi KACHA NMA karịa ozi niile!
MEE NKE A
Kesaara onye ị maara ozi ọma a: na Jizọs bụ Ọkpara Chineke nakwa na Ekeresimesi bụ ememe ọmụmụ Ya!
KPEE EKPERE
Ezi Chineke m, ekelee m Gị maka izitere anyị Ọkpara Gị Jizọs ka Ọ bụrụ Onye-Nzọpụta anyị. Nyere anyị aka ịkọrọ ndị ọzọ anyị maara ọkpụkpọ-òkù ọma a, bụ ndị kwesịrị ịma Gị!
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ nke ụbọchị iri na abụọ a maka ụmụaka, ị ga-agụ ihe niile gbasara onyinye udo nke na-abịa site n'aka Jizọs na otu anyị ga-esi nweta udo ahụ n'ime obi anyị kwa ụbọchị!
More