Ekeresimesi Maka Ụmụaka: Ụbọchị Iri Abụọ Nke UdoIhe Atụ
Chai, Abalị Dị Nsọ
Sitere Na Nick W. /h3>AKỤKỌ
Ọ̀ dịtụla ihe mere gị nke ị na-atụghị anya ya? Ihe ịtụnanya ndị a nwere ike ịdị mma ma ọ bụ dị njọ. Echetara m na mgbe m nọ grade 7, mama m na papa m bịara n'ụlọ akwụkwọ m ibutere m nri ehihie maka ememe nke ụbọchị a mụrụ m! Ha bu baluun na ais krịm gafee n'ihu dum ebe ndị ụmụ akwụkwọ n'eri nri. Ihe ha mere tụrụ m ezigbo anya, mana o metụrụ m obere ihere. Ụbọchị ahụ dị nnọọ ka ụbọchị agụm-akwụkwọ ndị ọzọ tupu ihe mara mma emee nke mere ka ụbọchị ahụ bụrụ nke tọrọ m ezigbo ụtọ!
AKWỤKWỌ NSỌ
Gụọ Luk 2:4–7.
TỤLEE NKE A
Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị Izrel nọ n'eche ka Onye Nzọpụta bịa. Mana mgbe O mechara bịa, Ọ bịaghị dịka ha chere na Ọ ga-abịa. Jizọs bụ eze, mana ọmụmụ Ya abụghị ihe ị ga-atụ anya ya maka onye bụ eze. A mụghị Ya n'obí ma ọ bụ n'ime nnukwu ụlọ ma ọ bụ ọbụna n'ụlọ nkịtị. A mụrụ Jizọs n’oba n’ihi na o nweghị ohere nọ ebe ọbụla maka Ya. E jighị ndị eze na ndị agha na ndị odibo gbaa Ya gburugburu; Ya na mama Ya, papa Ya, na ndị ọzụzụ-atụrụ ole na ole bịará ileta Ya nọ̀—ndị mmadụ achọghị ka ha na ndị ọzụzụ-atụrụ na-akpakọrịta ma ọlị n’ihi na a na-ahụ ha ka ndị ruru unyi.
Ọmụmụ Jizọs adịghị ka ihe nnukwu meré ma ọ bụ ka ihe dị mma ile anya, mana ọ bụ kpọmkwem ihe Chineke kwadoro. Abalị a mụrụ Jizọs dị nsọ n’ihi na Onye-Nzọpụta nke ụwa abịala n’ụwa n’ikpeazụ! Nye ndị bi na Betlehem, ọ ga-abụ na ọ bụ abalị dị jụụ na nke ihe ukwu emeghị, n’agbanyeghị na ihe dị ịtụnanya mere.
MEE NKE A
Gị na ndị mụrụ gị gụọ Luk 2:4–7, ma gbalịa chee echiche banyere ihe Meri na Josef ga na ahụ n'anya na n'esite n'imi n’abalị ahụ a mụrụ Jizọs. Detuo ụfọdụ n'ime ihe ndị ahụ!
KPEE EKPERE
Jizọs, daalụ maka abalị ahụ a mụrụ Gị. A dị m ezigbo ekele na Ị hapụrụ ocheeze Gị dị nsọ n'eluigwe ịbịa n'ụwa ịbụrụ Onye Nzọpụta anyị. Amen!
Ọ̀ dịtụla ihe mere gị nke ị na-atụghị anya ya? Ihe ịtụnanya ndị a nwere ike ịdị mma ma ọ bụ dị njọ. Echetara m na mgbe m nọ grade 7, mama m na papa m bịara n'ụlọ akwụkwọ m ibutere m nri ehihie maka ememe nke ụbọchị a mụrụ m! Ha bu baluun na ais krịm gafee n'ihu dum ebe ndị ụmụ akwụkwọ n'eri nri. Ihe ha mere tụrụ m ezigbo anya, mana o metụrụ m obere ihere. Ụbọchị ahụ dị nnọọ ka ụbọchị agụm-akwụkwọ ndị ọzọ tupu ihe mara mma emee nke mere ka ụbọchị ahụ bụrụ nke tọrọ m ezigbo ụtọ!
Gụọ Luk 2:4–7.
Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị Izrel nọ n'eche ka Onye Nzọpụta bịa. Mana mgbe O mechara bịa, Ọ bịaghị dịka ha chere na Ọ ga-abịa. Jizọs bụ eze, mana ọmụmụ Ya abụghị ihe ị ga-atụ anya ya maka onye bụ eze. A mụghị Ya n'obí ma ọ bụ n'ime nnukwu ụlọ ma ọ bụ ọbụna n'ụlọ nkịtị. A mụrụ Jizọs n’oba n’ihi na o nweghị ohere nọ ebe ọbụla maka Ya. E jighị ndị eze na ndị agha na ndị odibo gbaa Ya gburugburu; Ya na mama Ya, papa Ya, na ndị ọzụzụ-atụrụ ole na ole bịará ileta Ya nọ̀—ndị mmadụ achọghị ka ha na ndị ọzụzụ-atụrụ na-akpakọrịta ma ọlị n’ihi na a na-ahụ ha ka ndị ruru unyi.
Gị na ndị mụrụ gị gụọ Luk 2:4–7, ma gbalịa chee echiche banyere ihe Meri na Josef ga na ahụ n'anya na n'esite n'imi n’abalị ahụ a mụrụ Jizọs. Detuo ụfọdụ n'ime ihe ndị ahụ!
Jizọs, daalụ maka abalị ahụ a mụrụ Gị. A dị m ezigbo ekele na Ị hapụrụ ocheeze Gị dị nsọ n'eluigwe ịbịa n'ụwa ịbụrụ Onye Nzọpụta anyị. Amen!
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ nke ụbọchị iri na abụọ a maka ụmụaka, ị ga-agụ ihe niile gbasara onyinye udo nke na-abịa site n'aka Jizọs na otu anyị ga-esi nweta udo ahụ n'ime obi anyị kwa ụbọchị!
More