Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ekeresimesi Maka Ụmụaka: Ụbọchị Iri Abụọ Nke UdoIhe Atụ

Christmas for Kids: 12 Days of Peace

ỤBỌCHỊ 11 NKE 12

Abalị Jupụtara Na Kpakpando

Nke Nick K.

AKỤKỌ
Ò nwetụla mgbe ị nọdụrụ ala n’èzí n'abalị wee lelie anya gị elu iji hụ mbara igwe? Iwepụtà oge lelie anya elu nwere ike ime ka anyị chee echiche banyere ihe dị ukwuu. M na-anọkarị n'èzí n'abalị, n'ele mbara igwe anya. Ọbụna ugbu a, mgbe ihu elu igwe dị nnọọ mma, m n'apụ ka m jegharia ije gburugburu ebe m bi. Ọ bụ n'oge dị otu ahụ ka ọ n'adị m ka Chineke n'adọtakwu m n'akụkụ Ya. Ihu igwé abalị na-eme ka m chọọ ịnọ jụụ wee chee echiche banyere Chineke.

AKWỤKWỌ NSỌ
Gụọ Matiu 2:1–11.

TỤLEE NKE A
Ndị nwoke-amamihe (ma ọ bụ ndị mejai) ahụ abụghị ndị Juu, ma ha maara na Chineke na-agbalị ịgwa ha ihe dị mkpa site na mbara igwe nke abalị. Ha mere njem dị ezigbo anya n’ihi ihe ha hụrụ. Ha pụrụ ime nke a n’ihi na ha nọ na-aṅa ntị n’ihe Chineke na-agwa ha.

Mgbe ha rutere Izrel, ha jụrụ Eze Herọd ebe ha ga-ahụ “Eze ndị Juu” a. Herọd gbakwara mbọ ịchọpụta ebe a ga-amụ Ya. Ọ chọpụtara site n’ịjụ ndị maara Okwu Chineke na a ga-amụ Onye Nzọpụta na Betlehem.

Ị̀ ma ihe mere mgbe ndị nwoke-amamihe ahụ hụchara Jizọs? Chineke dọrọ ha aka ná ntị ná nrọ ka ha ghara ịlaghachikwuru Herọd n’ihi na o nwere atụmatụ ọjọọ.

Chineke na-ekwu okwu n’ụzọ dị iche iche iji dọta uche anyị—ụzọ kachasị doo anya bụ site n’Okwu Ya, Akwụkwọ Nsọ, na site n’ekpere. Karịa ihe ọ bụla, Chineke chọrọ ka gị na Ya dị nso. Ọ bụrụ na anyị amalite ịṅa Ya ntị, anyị kwa, pụrụ ịchọpụta ihe Ọ na-agwa anyị.

MEE NKE A
Rịọ nne ma ọ bụ nna gị ka ha soro gị gagharitú n'ezi ebe ibi tupu ị lakpuo ụra. Lelie anya gị elu iji hụ kpakpando ma gee ntị ka i wee nụrita mkpọtụ ndị na-emegharí n'abalị. Gwa Chineke okwu n'ime obi gị banyere ihe i nọ n'eche ka i nọ n'aga ije.

KPEE EKPERE
Ezi Chineke m, daalụ maka udo nke Ị n'eweta site n’aka Jizọs. Nyere m aka iche echiche banyere ụzọ Gị gasị. Nyere m aka icheta Jeremaịa 33:3 nke sí: “Kpọkuo M, M ga-azakwa gị, gosikwa gị ihe ndị dị ukwu na dị ike nke ị na-amaghị.” Amen.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 10Ụbọchị 12

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Christmas for Kids: 12 Days of Peace

N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ nke ụbọchị iri na abụọ a maka ụmụaka, ị ga-agụ ihe niile gbasara onyinye udo nke na-abịa site n'aka Jizọs na otu anyị ga-esi nweta udo ahụ n'ime obi anyị kwa ụbọchị!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Calvary Chapel Ft. Lauderdale maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://CalvaryFTL.org/Bible-Plans