Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ekeresimesi Maka Ụmụaka: Ụbọchị Iri Abụọ Nke UdoIhe Atụ

Christmas for Kids: 12 Days of Peace

ỤBỌCHỊ 1 NKE 12

Atụmatụ Chineke Maka Udo

Nke Nick W. strong>

AKỤKỌ
Oge mbụ m mere kukì Ekeresimesi, ọ dị ka a tụrụ bọmbụ ebe ahụ. Ntụ ọka wụsachara ebe niile. Ọ bụrụ na o nwetula mgbe ị mere kukì ma ọ bụ nwa keekì gasị, ị maarà na ruo mgbe ọ na-esi n'ekwú pụta, o dịghị eyi ka ihe ga-atọ ụtọ. Ị na-agwakọta ntụ ọka ọcha, kuwaa akwa n'ime ya ma tụba nwa chokoleetị ma i chọọ . . . ihe nke a ga-atogbú onwe ya. Mana mgbe i wepụtara ya n'ekwú, ọ n'esi ezigbo ísì ma dị nma ile anya nke ukwuu!

AMAOKWU
GụọJenesis 22.

Tụlee Uche Na Nke A
Ihe nke a n'esí ike ịghọta! Gịnị mere Chineke ga-eji gwa Ebraham ka o gbuo nwa ya ka ọ bụrụ àjà? Nke ahụ dị ka ihe n'ekopù isi! Mana Ebraham maara na Chineke bụ ezi Chineke nke dị ịhụnanya na nke na-agaghị eme ka o mee ụdị ihe ahụ. O nwere okwukwe na ya na nwa ya nwoke ga-esi n’ugwu ahụ ridata. Ha mekwara otu ahụ! Dị ka Ebraham kwuru, Chineke nyere nwa atụrụ ejiri tuó àjà.

Ị̀ ma onye ọ bụla ọzọ n'Akwụkwọ Nsọ nke nyere Ọkpara Ya ka O bụrụ àjà? Ọ bụ Chineke mere otu a! Akụkọ Ebraham na Aịzik mere ka anyị debe obi na Jizọs bụ́ Ọkpara ahụ nwụrụ́ n’ihi mmehie anyị. Ọrụ ya bụ ichebe anyị ihu na Jizọs maka na Chineke n'ekpughe atụmatụ Ya maka udo ọtụtụ puku afọ tupu a mụọ Jizọs!

Mgbe anyị na-agụ Akwụkwọ Nsọ, anyị na-ahụ ụdị ihe nyiri nghọta dị otu a, na-eme! Na ndụ anyị taa, mgbe ụfọdụ ọtụtụ ihe n'emé nke anyị n'apụghị ịghọta. Anyị na-echegbu onwe anyị, bee ákwá, na-atụ ụjọ, ma ọ bụ na-arịa ọrịa, ma ọ bụ nwee mgbagwoju anya.

Otu ọ dị, Chineke na-egosi anyị n'ime Akwụkwọ Nsọ na O nwere atụmatụ zuru oke maka udo, ọbụna mgbe ihe niile dị n'ọgba-aghara. Dịka otu kukì si dị njọ ile anya tupu ya esi n'ekwú pụta mgbe e sichara ya. Chineke nwere atụmatụ izite Ọkpara Ya, bụ́ Jizọs, ịnwụ maka ihe ọjọọ niile anyị mere ka anyị ghara inwu n'ihi ha. Chineke pụrụ ịgbaghara mụ na gị, n’ihi na Jizọs kwụrụ ụgwọ mmehie diirí anyị: ọnwụ. Ibi ndụ na Chineke bụ udo, anyị pụrụ inweta nke ahụ site n'aka Jizọs!

MEE NKE A
Taa, depụta otu ihe n'ezighị ezi ma ọ bụ nnupụisi ị mere n’izu gara aga. Mgbe ị mechara nke a, gị na nne gị ma ọ bụ nna gị kpekọtá ekpere ma kelee Chineke na O nyela gị udo n'ihi Jizọs.

KPEE EKPERE
Ezigbo Chineke, ekelee m Gị maka udo nke Ị wetara m site n’aka Jizọs. Ekelee m Gị na n'agbanyeghị na ọ bụ ezie na m emehiewo, Ị n'agbaghara m ma n'eweta udo n'ụwa. Amen.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Christmas for Kids: 12 Days of Peace

N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ nke ụbọchị iri na abụọ a maka ụmụaka, ị ga-agụ ihe niile gbasara onyinye udo nke na-abịa site n'aka Jizọs na otu anyị ga-esi nweta udo ahụ n'ime obi anyị kwa ụbọchị!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Calvary Chapel Ft. Lauderdale maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://CalvaryFTL.org/Bible-Plans