Ekeresimesi Maka Ụmụaka: Ụbọchị Iri Abụọ Nke UdoIhe Atụ
Ụlọ Nke Udo
Sitere Na Nick K. /h3>
AKỤKỌ
Ọ kwà i hụla otù ịnọ n’ụlọ si enye aṅụrị dị iche karịa ịnọ n’ebe ọ bụla ọzọ? Ụlọ kwesịrị idi nchebe karịa ebe ọbụla ọzọ. Mgbe oyi na-atụ, ụlọ kwesịrị ị n'enye okpomọkụ na-achụpụ oyi. Mgbe agụụ na-agụ gị, nri kwesịrị ịdị na-echere gị n'ụlọ. Mgbe enwere nsogbu n'èzí, ụlọ kwesịrị ịbụ ebe ị ga-agbaba wee nata ezumike. . . mana adịghị enweta ihe ndị a n'ụlọ tiwara etiwa.
Anyị niile maara otú ọ na-adị mgbe ihe na-adịghị mma n'ụlọ. Mana ọbụlagodi mgbe ihe ezughị okè n'ụlọ, anyị kà nwerè nkwa nke ihe ụlọ kwesịrị ịbụ.
OKWU CHINEKE
Gụọ2 Samuel 7:11–14.
TỤLEE NKE A
Ikwu eziokwu, nke a bụ Okwu Chineke na-adọrọ mmasị ma a bịa n'udo! N'otu aka, ọ na-ada ka ihe magburu onwe ya. Chineke kwere Devid nkwa na ezinụlọ ya ga-enweta ngọzi Chineke ruo mgbe ebighị ebi. Ị̀ nwere ike iji anya-uche gị hụ obodo ebe udo dị adị maka mmadụ niile? Ihe mara mma!
Ị̀ gụrụ akụkụ ikpeazụ nke Okwu Chineke ahụ? Ọ bụrụhaala na eze nke si n'ezinụlọ nke Devid na-eso Chineke, ihe ga-adị mma; ma ọ bụrụ na ya ajụ ụzọ Chineke, ntaramahụhụ aghaghị idakwasị ya. KA M GWA GỊ IHE MERE KÀ OGE GATỤRỤ̀: Nwa Devid esoroghị Chineke otú o kwesịrị, ya adịkwa ka ezinụlọ Devid ha lara n'iyì.
Nke ahụ ọ̀ pụtara na nkwa Chineke kwerè maka iguzobe alaeze udo ruo mgbe ebighị ebi agaghị emezi? Mbanụ! O dorò anya na nkwa a abụghị naanị banyere nwa Devid (Solomon) kama ọ bụ banyere Ọkpara nke ga-abịa ọtụtụ narị afọ kà e mesịrị. Jizọs bụ̀ Eze n’ezinụlọ Devid nke bụkwaỌkpara Chineke. Ebe mba na ndị eze na-adà kuo afọ n'ala, Jizọs na-eweta udo na-adịgide adịgide nke anyị nọ n'echere.
Ị̀ chetara ihe m kwuru gbasara ụlọ? Anyị niile chọrọ ụtọ nke ụlọ mgbe ụlọ dị mma. Nke ahụ bụ udo. Ezinụlọ Devid apụghị inwe ụdị udo ahụ zuru oke n'oge ha, dịka ụlọ anyị agaghị adị mma mgbe niile n'oge anyị. Mana O tinyere echiche nke udo na ụlọ n’obi anyị n’ihi na otu ụbọchị, Jizọs ga-emezu nkwa ahụ Chineke kwerè n’oge dị anya gara aga.
MEE NKE A
Ị nwere ike ịbụ udo ahụ nye mmadụ ibe gị ụbọchị taa! Gị na otu onye n'ime ezinụlọ gị pụọ n'èzí gwuo egwu, mgbe unu mechara, batanụ n'ime ụlọ wee gụọ ihe.
KPEE EKPERE
Ezi Chineke m, daalụ maka udo nke Ị na-ewetara anyị site n’aka Jizọs. Nyere m aka ime ka ndị ọzọ nwee mmetụta udo nke Ị nyeworo m. Nyere m aka ime ka ndị ọzọ nwee mmetụta nke udo na-adị n'ụlọ! Amen.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ nke ụbọchị iri na abụọ a maka ụmụaka, ị ga-agụ ihe niile gbasara onyinye udo nke na-abịa site n'aka Jizọs na otu anyị ga-esi nweta udo ahụ n'ime obi anyị kwa ụbọchị!
More