Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ekeresimesi Maka Ụmụaka: Ụbọchị Iri Abụọ Nke UdoIhe Atụ

Christmas for Kids: 12 Days of Peace

ỤBỌCHỊ 5 NKE 12

Onye-Isi Udo

Sitere N’aka Nick W. /h3>

AKỤKỌ
Mgbe m bụ nwata, ezigbo ụjọ n'atụ m ịnọ naanị m. N’otu oge, ndị mụrụ m gara oriri Ekeresimesi, ezigbo ụjọ ewee jide m mụ ịnọ naanị m, m wee kpọọ ha ka ha lọta ngwa ngwa n'agbanyeghị na ụmụnne m ndị nwaanyị achọghị m ka m mee otú ahụ. Ozugbo ha lọtara, ọbụna na obi adịchaghị ha mma n'ihi àgwà m kpara, egwù ejideghikwa m ọzọ.

Ọ dịtụla mgbe ị nọ naanị gị n'ụlọ, ma ọ bụ i nọ n'ime ọnụ-ụlọ gị n'oge abalị ezigbo egwù ewee jide gị? Ezigbo egwù a jidere gị nke mere na gị etie mkpu ka mama gị na papa gị bịa nọnyere gị? Ịnọ naanị gị n'ime ọchịchịrị pụrụ ịbụ ihe na-atụ ezigbo egwù, mana ozugbo mama gị na papa gị n'abata n'ime ọnụ-ụlọ i nọ na ya, egwù gị na-agbapụ ọsọ, ahụ ewee dị gị jụụ.

OKWU CHINEKE
GụọAịzaya 9:6.

TỤLEE NKE A
N’amaokwu Akwụkwọ Nsọ a, Aịzaya onye amụma na-agwa ụmụ Izrel banyere otu Eze nke gaje ịbịa n’ụwa, otu n’ime aha otutu Ya bụkwa “Onye-Isi Udo.” Aịzaya nọ n'ekwu banyere Jizọs!

Jizọs bụ Onye-Isi Udo n’ihi na n’alaeze Ya Ọ na-eweta udo n’elu ihe niile e kere eke! Mana cheregodí . . . gịnị mere udo abatabeghị n'ime ihe ndị anyị na-ahụ anya na nke n'eme n'ụwa ugbu a? Ajụjụ a dị mma! Mgbe Jizọs ga-abịaghachi n'elu ụwa a, ọ bụ mgbe ahụ ka ezi udo ga-adị n'ụwa a. Mana ruo mgbe ahụ, Jizọs na-ekwu na anyị na Ya nwere ike ịna enwe mmekọrịta ma anyị enwee udo ọbụna mgbe ihe ndị na-adịghị enye udo n'eme. Mgbe anyị nabatara Jizọs n’ime obi anyị, mmụọ Ya na-abịa ka anyị na Ya biri, n’ime obi anyị. Cheta nkata anyị kpara otu mgbe mama anyị na papa anyị batara n'ime ọnụ-ụlọ anyị nọ, ahụ na-eru anyị ala, anyị enwee udo, egwù adịghịkwa atụ anyị ọzọ? Ka m gwa gị, n'ihi na Jizọs bi n'ime obi anyị, Ọ nọnyeere anyị mgbe niile, na-agwa anyị okwu, na-akasi anyị obi, na-akụziri anyị ihe, n'enyekwa anyị udo Ya.

Ụwa n'enweghị onye nzọpụta dị ka nke udo na-adịghị nye ụmụ Izrel, mana Chineke kwere nkwa iweta Ọkpara Ya dị ka Onye-Isi Udo ka udo dị n'etiti ha na Chineke nakwa ha na mmadụ ibe ha. Jizọs bụ udo anyị! Ekeresimesi bụ oge dị mma iji cheta na mee ememe nke ahụ.

MEE NKE A
Na akwụkwọ odide ma ọ bụ na ngwá dị n'ime foonụ gị, see ihe ị chè na Onye-Isi Udo dị kà.

KPEE EKPERE
Ezigbo Chi m, daalụ maka izite Jizọs dịka Onye-Isi Udo. Obi dị m ụtọ na Ị kwere nkwa na anyị pụrụ inwe udo n’agbanyeghị ihe ọ bụla, n’ihi Jizọs. Amen.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 4Ụbọchị 6

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Christmas for Kids: 12 Days of Peace

N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ nke ụbọchị iri na abụọ a maka ụmụaka, ị ga-agụ ihe niile gbasara onyinye udo nke na-abịa site n'aka Jizọs na otu anyị ga-esi nweta udo ahụ n'ime obi anyị kwa ụbọchị!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Calvary Chapel Ft. Lauderdale maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://CalvaryFTL.org/Bible-Plans