Ekeresimesi Maka Ụmụaka: Ụbọchị Iri Abụọ Nke UdoIhe Atụ
Immanuel: Chineke Nke Udo Nke Nọyeere Anyị
Sitere Na Sabrina
AKỤKỌ
Enwere m ọtụtụ ncheta dị́ ụtọ banyere otù abalị-gasị nke Ekeresimesi dị mgbe m bụ nwata. Ọṅụ anyị kachasịnu abụghị inata onyinye Ekeresimesi gasị, kama ọ bụ anyị igbalì ịchọta ka a ga-esi enye anyị ha. Echetara m otu afọ, papa m tinyere onyinye Ekeresimesi niile n'elu ụlọ mana mgbe ọ gara iweta ha, gịnị ka iche merenụ? À n'ekwu ya ekwu, o si n'elu ụlọ daa! N'afọ ọzọ, ọ hapụrụ onyinye Ekeresimesi anyị n'akụkụ ebe a n'egwu mmiri ma mgbe ọ gara iweta ha, gịnị mere? Ọzọkwa, ọ dabara n'ime pụl mmiri ahụ!
Kedụ ncheta gasị dị ụtọ nke Ekeresimesi kacha amasị gị?
AKWỤKWỌ NSỌ
Gụọ Matiu 1:18–24.
TỤLEE NKE A
Ihe ọma, nke a bụ ihe akụkọ Ekeresimesi bụ̀, ọmụmụ Jizọs! Matiu na-agwa anyị banyere Ekeresimesi mbụ Jizọs mere, otú Chineke siri lekọta Josef na Meri, ọbụna igwa ha ihe aha Ya ga-abụ. Nke a ọ bụghị ihe dị ezigbo ịtụnanya? Na ọbụna taa, ihe karịrị afọ 2,000 ka e mesịrị, otu ụbọchị n'afọ kwa afọ anyị nwere ike ịkwụsị, tulee, cheta, na kọọ akụkọ Ekeresimesi ọzọ.
Weregodị ya na ị na-ajụ Jizọs ihe Ekeresimesi bụ maka ya. O nwere ike Ya aza gị na ememe Ekeresimesi bụ n'aha Ya: Chineke nọ́ ebe a, Chineke nọnyeeré anyị! Ee, mgbe a mụrụ Jizọs, Chineke nọ n’etiti anyị. Ọ bịara ka anyị na Ya biri n’ụwa inapụta anyị ná mmehie anyị ka O wee dịrị ndụ n’ime obi anyị nakwa ka anyị na ya biri n’eluigwe!
Ahụrụ m n'anya nke ukwuu egwú si na “Chineke anọghị n’ebe dị anya na mbara igwe hapụ m ka nwa mgbei, mana Ọ nọ n’akụkụ m n’ihi na ụbọchị ọ bụla; ana m ahụ aka ọma Ya na-elekọta m, ya mere m ji enwe udo." Ọ nọ n'etiti anyị, Ọ bịara iweta udo n'ụwa! Nke ahụ bụ ihe Ekeresimesi bụ̀ maka ya.
MEE NKE A
>Weregodị ya na gị na Jizọs ga-enwe nzukọ pụrụ iche ụbọchị taa. Were ụfọdụ ndetụ i mere bụ̀ ihe ndị i chọrọ ịgwa Ya. Kpee ekpere ma gwa Ya ihe niile i dere. Ọ nọnyeere gị taa, ọbụna ka ị n'agụ ihe a!
KPEE EKPERE
Ị meela, Jizọs, maka ịnọ ebe a na ilekọta mụ na ezinụlọ m. Daalụ maka Ekeresimesi na daalụkwa maka iwetara anyị udo! Amen.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ nke ụbọchị iri na abụọ a maka ụmụaka, ị ga-agụ ihe niile gbasara onyinye udo nke na-abịa site n'aka Jizọs na otu anyị ga-esi nweta udo ahụ n'ime obi anyị kwa ụbọchị!
More